Herder Farmer Crisis: Ụjọ m bụ na esemokwu a nwereike ịghọrọ agha ọzọ - Wole Soyinka

Ebe foto si, AFP
Odeeakwụkwọ a ma ama bụ Wole Soyinka kwuru na ndị ọchịehi esunyela agha na Naịjirịa.
Ọ gwara BBC nke a na mkparịtaụka ha na ya nwere gbasara ọnọdụ esemokwu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo.
Soyinka kwuru na eziokwu bụ na ihe kara ndị ọchiehi obi ị kpa ụdịrị agwa ha na-akpa bụ na ha cheere na onye nke ha nọ n'ọchịchị
O kwuru na "anyị nwereike ịbanye oge esemokwu a ga-aghọrọ ịlụ ọgụ ma ghọrọ kwa... a chọghị m ịkpọ okwu ahụ aha - agha ịmeụlọ ọzọ nke ga-aka njọ..."
"Ọ bụ olileanya m na oge ga-eru mgbe a ga-anapụ ndị ọchịehi ngwa agha ọbụla ha ji ma laghachi n'oge ọ bubụ naanị osisi na igwe okwu ka ha na-eji bu"
Lee n'afọ 2019 mgbe ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ si ha machịrị nchịgharị ehi

Ebe foto si, Presidency/Twitter
Ndị mmadụ nọ n'elu soshal midia asa gọvanọ Dave Umahi bụ onyeisi ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ maka etu o si kwuo na o teelarịị ha machịrị ichị ehị gagharị na mpaghara ahụ.
Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ iwu Nnamdi Kanu nyere ha ọhụrụ a mere ha ji pụta kwuo nke a.
Cheta na Gọvanọ ndị na-achị steeti dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ kpebiri na iwu ga-emegide ịchị ehi na-agagharị na mpaghara ahụ kamgbe afọ 2019.
Ha mere mkpebi a na nzukọ pụrụiche ha nwere n'Enugwu.
Ha machichara ndị ọchịehi ibu egbe AK47 ma o bụ mma agagharị.
Ndị Gọvanọ a kwuru na ndị nchekwa steeti ha niile ga-eso hibe iwu a.
Onye mgbasa ozi nke Gọvanọ Ebonyị steeti bụ Mazi Emmanuel Uzo gwara BBC na nke a bụ maka nchekwa obodo ndị dị n'Ọwụwa Anyanwu.
Ụzọ gwara BBC na ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ga-edegara Onyeisiala bụ Mohhammadụ Buhari akwụkwo, ka enwe nzụkọ ha na ọnyeisiala na ndị isi ngalaba nchekwa n'Naijirịa maka usoro a ga-eji weta udo n'Ọwụwa Anyanwụ.
O kwukwara na n'oge na adịghị anya, na ndị Gọvanọ steeti ọzọ n'Ọwụwa Anyanwụ ga ehibekwa ngalaba ndị na-echekwa ime ọhia a kpọrọ 'Forest Guard' dịka e si nwee n'Enugwu Steeti.
N'otu aka ahụ, ha hiwekwara atụmatụ a ga-eji ụgbọelu chụpụsịa ndị omekome nọ n'ọhịa n'Ọwụwa Anyanwụ ma hiwekwa otu ga na-ahụ maka nchekwa nke ndị Abel Obi Umahi bụbụ ọchịagha ga-anọ n'isi ya.

Otu ihe ọzọ ha kwukwara maka bụ ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam, bụ nke ha sị Minista na-ahụ maka ụgbọelu kwere nkwa na a ga-arụ n'ọnwa Decemba nke afọ a.
Ha sịkwa na a ga-ahazi ọdọ ụgbọelu Sam Mbakwe nke dị na Owerre ka ọ nabata ụgbọelu kwesiri ịga Enugwu ma hụ na nchekwa dịrị ndị na-eme njem.






























