Fulani herdsmen Crisis: Aka akparala onye Fulani ọchịehi bu akpa mgbọ egbe akpagharị

Mgbọegbe

Ebe foto si, Banks Photos

Nkọwa foto, Mgbọegbe

Otu onye Fulani ọchịehi ejejiela chi dịka a nwụchiri ya Tuzde e be obu akpa mgbọ egbe akpagharị.

Nke a mere n'obodo a kpọrọ, Obudi Agwa Autonomous Community nke dị n'okpuru ọchịchị Oguta n'Imo Steeti.

Akụkọ kọrọ na ha dị ndị ọchịehi abụọ na-akpagharị n'ogbe ahụ, otu n'ime ha bu egbe ọgbatụwatụwa.

Mana onye nke bu egbe gbalagara ọsọ.

Ndị na-agba mgbere ehi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị na-agba mgbere ehi

Mgbe ha jụrụ onye nke ọzọ ihe dị n'akpa o bu, o kwuru na ọ bụ garrị.

Ma mgbe ha naara ya akpa ahụ n'ike, mepee ya, ha hụrụ na ọ bụ mgbọ egbe juru na ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Imo steeti bụ Ikeogu Orlando gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere eme n'eziokwu.

Ọchịehi bu egbe

Ebe foto si, Eric Lafforgue/Art in All of Us

Nkọwa foto, Ọgbaaghara sitere n'aka ndị ọchịehi abụghị ihe ọhụrụ na Naijiria nakwa na Ọdịda Anyanwụ Afrịka

O kwuru sị, "A natara onye ọchiehi ahụ mgbọ egbe agbabeghi agba ruru iri anọ na abụọ.

"Anyị anwụchiela ya ugbua, ọ nọ n'ogige anyi, mana anyị ka na-eleba okwu ahụ anya".

Okwu banyere ndị ọchịehi na-arị elu na Naijiria ugbua.

N'ọgbakọ ndị 'Northern Elders Forum' nwere ụbọchị Tuzde, ndị isi ndị Ugwu gwara umunne ha ka ha hapụ mpaghara ndịda ma lọtawa be ha.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gi:

Aha onyonyo, Morocco nwa Maduka: