"El Chapo" ga-atakute ya kọnkịrị n'ụlọmkpọrọ ruo mgbe ọ ga-anwụ

Ebe foto si, EPA
Ndị ụlọikpe mba Amerịka ekwuola ihe ga-eme Joaquin Guzman eji "El Chapo" mara.
Ulọikpe dị na mba Amerịka atụọla ya nga mkpụrụ ọka ogologo ndụ ya niile ma tinyekwa ya jara afọ iri atọ maka ire ọgwụ ike.
A mara ya ikpe ụzọ iri gụnyekwara ịda iwu gbasara ibupu nnukwu ego.
El Chapo kwuru na ikpe e kpere ya ezighị ezi.
Cheta na ejidere ya ma tụo ya nga ugboro abụọ na Mexico ma ọ mipuru na nga gbafuo tụpụ nke igbazu a nwudere ya.
Ohaneze asahachila ndị NEF

Ndị Ohaneze, Ipob na otu Njikọ Igbo efufeela isi sị na onweghị ndị ha sị ka ha kwara si ala Igbo pụọ.
Ihe butere okwu a bụ ọsisa ha n'ebubo ndị otu Northern Elders Forum (NEF) na otu 'Coalition of the Northern Groups' boro ndị ndu ndịda Naịjiria gụnyere ndị gọvanọ.
Ebubo a n'ekwu na ha majara ndị Fulani ọchịehi sị na ha ga-ebuso ha agha.
Ụlọomeiwu anabatala okaikpe kachasi ohụrụ

Ndị ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa ahọpụtala Tanko Mohammed dị afọ iri isii na isii dịka Onye ọkaikpe kachasị na Naijirịa.
Nke a pụtara ihe dịka ụfọdụ ndị omeiwu gbachara ya ajụjụ ọnụ nke were otu awa na ọkara.
Newcastle ataala igu n'aka Wolves FC

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu bọọlụ Wolves FC ejirila ọkpụ goolu anọ asataghị ma otu were zọọ ndị Newcastle United Ojukwu.
Nkea na-eme dịka ha na-anabata Steve Bruce dịka onyendu ndị otu bọọlụ Newcastle.
Ihe Buhari kwuru maka ụgwọ opekatampe

Ebe foto si, Twitter/Muhammadu Buhari
Obi na-atọ ndị ọrụ gọọmentị etiti rịkpọọ dịka onyeisiala Muhammadu Buhari nyerela iwu ka a malite ịkwụ ha ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ nke pụtara puku naịra iri atọ.
Mana iwu a ga-emetụta sọọsọ ndị ụgwọọnwa ha na-erubughị puku naịra iri atọ mgbe gara aga, ebe mkparịtaụka ka na-aga n'ihu maka nke ndị ọzọ.
'Ndị Fulani ọchiehi lọtawanu o'!

Ebe foto si, Getty Images
Otu jikọrọ ndị okenye ndị Ugwu akpọọla oku ka ndị ọchịehi niile nọ na ndịnda anyanwụ lọghachi Ugwu Awụsa na-egbughi oge.
Ha kwuru nke a dịka ha mechara ọgbakọ nke ndị 'Northern Elders' Forum' n'ụbọchị Tuuzdee.
Onyeisi otu ahụ bụ Ango Abdullahi kwuru na ndị be ha na-achị ehi ejizighị ndụ ha n'aka n'ihi mmaja ndị ndu ndị Ọdịda-Anyanwụ na-amaja ha.
CAN agọlahụna ndị otu ha

Ebe foto si, @Biodun Fatoyinbo
Otu 'Christian Association of Nigeria (CAN) agọọrọla aka na ụkwụ ha banyere ụfọdụ ndị otu ha gara n'ụlọụka COZA ụbọchị ụka gara aga iji kwado ụkọchukwu Biodun Fatoyinbo bụ onye a na-ebo ebubo na ọ wakporo nwata nwaanyị n'ike.
O kwuru ọha otu CAN bụ Kwamkur Vondip kwuru na ọ bụghị ha zipuru ndị gara ije ahụ kama na ha gara n'isi onwe ha.
Iwu amaghị Eze

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi, e jichiela onye bụbu onyeisiala mba Peru, Alejandro Toledo na mba America dịka ala ya rịọrọ n' arịrịọ maka ebubo nrụrụaka.
Mana Toledo na-agọ na ya anaghị ngarị ruru nde dọla iri abụọ n'aka ụlọọrụ Brazil na-ewu ihe owuwu.
Agbaa nchi alaa nta

Ebe foto si, Twitter/@CAF_Online
N'egwuregwu, ndi otu Super Eagles ga-ezute ndị ogbo ha ndị mba Tunisia taa iji mara ndị ga-erite ọla nchara n' asọmpi iko mba Afrịka nke afọ a.
Asọmpi a ga-atajiri n'elekere asatọ nke abalị taa ebe ụmụ Naijiria ga-amata ma dika elu erughi ha aka, ala a ga-erukwa ha aka.
Akụkọ ga-amasị gị:











