National Security Summit: Ka anyị hibe ọgbakọ maka nchekwa Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa ekwuola ka ewere ọsọ were ije hibe ọgbakọ ga-etinye anya na nsogbu gbasara nchekwa n'obodo Naịjirịa.
Ha nwere nkwekọrịta a n'nzụkọ nke ha nwere na ụbọchị Tuzdeị 16 Julaị n'Abuja.
Ọ bụ onyeomeiwu Sinatọ Ayo Akinyelure (APC-Ondo) bulitere okwu a maka mgbagbu a gbagburu nwa Pa Reuben Fasoranti bụ onyeisi ndị otu Afenifere; Funke Olakunrin.

Ebe foto si, Other
Ndi omekaome gbagburu nwaanyị a n'ụzọ Akure-Ore n'Ondo Steeti n'ụbọchị Fraịde.
Onye ụlọomeiwu Sinatọ Tolu Odebiyi tinyekwara ọnụ n'okwu a were si na;
"O nweghi ihe ọbụla anyị na-eme ebe a nwere isi ma ọ bụrụ na anyị enweghi ike ichekwa ndị Naịjirịa."
O kwukwara sị "Kedụ uru ọ bara ma anyị bịa ebe ụbochị niile were otu nkeji kwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu ma ụmụ Naịjirịa na-anwụ kwa ụbọchị".
Buhari asaala edemede Obasanjo
N'aka nke ọzọ, aka na-achị Naịjirịa bụ Mohammadu Buhari azaala ndị na-akatọ ya maka enweghị nchekwa n'Naijirịa kwuo na ha niile enweghi mmụọ ihu Naịjirịa n'anya n'ime ha.
Buhari kwuru nke a dịka ya na ndị "Buhari Campaign Organisation" nwere ọgbakọ n'ụlọ onyeisiala nke dị na Abuja.
Onyeisiala gara n'ihu kọwaa na ndị a na akatọ ya maka mpu na ajọ ihe n'eme n'ebe dị iche iche nke a na enweghi ihe jikọtara ha ọnụ n'obodo Naịjirịa .
Buhari kwuru na mpụ na ajọ ihe a na-eme kwa n'obodo dị iche iche n'uwa niile gburugburu.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ kọwakwara na ndị ntọrị na ndị ọmekome chere uwa niile gburugburu aka mgba.
Okwu Onyeisiala Buhari Kwuru na-eso akwụkwọ ozi aka chiburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo dere ya maka ọnọdụ nchekwa na Naijirịa nke ọ kọwara na ọ na akanwanye njọ.
Lee ọkpụrụkpụ ihe asaa Obasanjọ kwuru na akwụkwọ ahụ o dere

Ebe foto si, Getty Images
1.Ọgbaaghara nwere ike ịda n'ihi na ndị mmadụ enwezighị ntụkwasịobi na gọọmentị ga-echekwa ha nke ọma.
Nke a ga-eme ka onye ọbụla chọwa ụzọ ichekwa onwe ya, nke nwere ike ibute ọgbaaghara n'obodo.
2.Aka ike agaghị akwụsị Boko Haram.
Gọọmentị kwesịrị ileba anya n'okwu agụghị akwụkwọ na enweghị orụ bụ nke kpatara ndị ntorobịa bi na mpaghara ugwu Naijiria ji esonyere ndị Boko Haram.
3.Gịnị ka ndị Fulani ọchiehi chọrọ:
Obasanjo kwuru: "Ihe ọbụla bụ iwe ndị Fulani, ha kwuo ya ka e lebaa ya anya, mara otu a ga-esi mee ya.
"Enwekwaa ndị ọzọ iwe dị n'obi, ha kwupute ya ka e lebaa ya anya.
"Mmiri ọjọọ na-eji na Naijiria, mmiri a ga-ebute mbibi, ọgbaaghara na mgbasa ma o zoo."

Ebe foto si, Getty Images
4.Kpọọ ọgbakọ ndị ma ihe ekwe na-akụ:
Ndị Obasanjo che na ha kwesịrị isonye n'ọgbakọ a bụ: ndị eze ọdinala, ndi isi ndị agha na ndi isi ndi uweojii (tinyere ndị larala ezumike), ndị isi okpukpere chi, ndị obodo ebe enwere ọgbaaghara, ndị gọvanọ (tinyere ndị pụrụla n'ọchịchị), ndị nnọchite anya Naijiria na mba ọzọ, wdgz.
5.Hapụnụ ịta onwe ụnụ ụta.
Obasanjo kwuru na ịta ụta na-eme ka obi daa mmadụ mba ma mee ka onyeiro siwanye ike.
O gara n'ihu kwuo na "ihe jọwa njọ, onye a ga-ajụ bụ onyeisiala".
6.Igwe bụ ike
Obasanjo kwuru na ihe niile gọọmenti na-eme kwesịrị ịbụ maka ọdịmma nke ọha obodo.
Nke a ga-eme ka ndị ọha obodo na-adọnyere gọọmentị ukwu mgbe niile.
7.Ihe mere na Yugoslavia nakwa Ruwanda nwekwara ike ime na Naijiria
Obasanjo kwuru na ma gọọmentị emeghị ngwa ngwa iji meghara ọdachị, ihe mere na Yugoslavia nakwa Rwanda n'oge gara aga nwere ike ime. "Chineke ekwela ihe ọjọọ!"










