Ọ bụ sọ sọ mmadụ abụọ n'ime mmadụ asatọ a wụrụ 'acid' ka nọ n'ụlo ọgwụ - Uweojii Anambra

Ndị uweojii Anambara steeti kwuru na mmadụ isii n'ime asatọ a wụrụ "acid" n'Ugwuagba, Obosi, anatala ọgwụgwọ ma laa be ha.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed, kwuru na mmadụ abụọ ndị ọzọ ka na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ St.Martins ka ndị uweojii nọ n'Awada kpọgachara ha ebe ahụ.
Dịka o si kwuo, mmadụ asatọ a dabanyere n'ọdachi a ka otu nwoke a na-amatabeghi aha ya maọbụ ebe o bi, na Onyeka Nwachukwu malitere ịkọ ọnụ ebe ha na-azụ ahịa na Mgbuka (ahịa a na-ere akụrụngwa igwe ụgbọala).
Ka ọnụ ha na-akọ malitere ịrị ibe ya elu, nwoke ahụ wụrụ Nwachukwu dị afọ 38, Ofili Benjamin dị afọ 32, Ofili Damian dị afọ 42 "acid".
Ndị ọzọ "acid" a metụrụ bụ Okoro Ebuka dị afọ 23, Ekwueme Anayo dị afọ 35, Nnamani Chukwu dị afọ 23, Obiora Chidubem dị afọ 18 nakwa Obasi Solomon dị afọ 24.
Haruna kwuru na ndị uweojii ka na-achọ onye kpara arụ a ka anwụchie ya ma gbaa ya ajụjụ.
Ha dụkwara ndị mmadụ ọdụ ka ha gbado anya ọkachasị ma ha hụ ndị gbara ihe na-edoghi anya na mkpọ, ma kpesa ndị ahụ n'aka ndị uweojii.
Wole Soyinka tinyere ọnụ n'okwu Buhari

Ọkammụta Naijiria bụ Wole Soyinka ka na-ekwusi ike na okwu banyere ọrụ nchekwa na Naịjiria karịrị ihe ọchịchị Muhammadu Buhari ga-emenwu naanị ya.
Soyinka kwuru nke a mgbe ọtụtụ ụmụakwụkwọ gara ikele ya n'emume ncheta ọmụmụ ya.
O kọwara na ọ ga-aka mma ma e nwee ọgbakọ ebe ndị niile ọnụ na-eru n'okwu na Naijiria ga-anọkọ na-agbanyeghi otu ndọrọndọrọ ọchịchị onye nọ na ya wee tụọ alọ otu a ga-esi kwọọ onye ukwu wara.
Njiji ejiela n'Anambra

Ebe foto si, AFP
Oke idei mmiri emebeiela ụlọ ruru narị atọ n'Okpoko nke dị n'okpuru ọchịchị Ogbaru.
Akụkọ kọrọ na ihe ruru mmadụ puku abụọ bụzị ndị enweghi ụlọ obibi ugbua n'ihi ihe ọdachị a dakwasịrị ha.
Ndị bi n'okirikiri ahụ na-ayọzị Gọvanọ Willie Obiano ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka tupu mmiri ebukọrọ ha nile.
Akụkọ si mba ofesi

Ebe foto si, EPA
Onye ode akwụkwọ ukwu na-ahụ maka mmekọrịta mba UK na mba ndị ọzọ bụ Jeremy Hunt amalitela atụmatụ ọzọ iji gbochie mba Iran inwe ogbunigwe 'nuclear'.
Hunt na ndị ogbo ya si mba Europe dị iche iche ga-enwe ọgbakọ taa iji mara ka a ga esi were ehihie chọwa ewu ojii tupu chi ejie.
Nigeria akwọọla aka tiere ọkụkọ akị

Ebe foto si, Reuters
N'egwuregwu, Iko mba Afrịka nke afọ a akwaala ndị otu Super Eagles nke Naijiria dika Algeria ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie ha ụnyaahụ.
Umu Naijiria ga-agbazị mbọ ịgbata ndị nke atọ mgbe ha ga-ezute ndị Tunisia ụbọchị Wenezdee.
Gụzuo maka egwuregwu ahụ ebe a: Ọ gwụsịwo! Algeria efoola Super Eagles nku ka a na-efo ajị imi
Akụkọ ga-amasị gi:








