Nigerian Police: Nyocha onye uweojii tupu o nyocha gị

Ndị uweojii na-enyocha ndị mmadụ

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị uweojii bụ ndị ọrụ nchekwa pụrụiche na-ahụ maka ime udo, nchekwa na nrubeisi n'iwu na-achị obodo.

N'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, ha na ndị mmadụ na-enwe mmekọrịta dị icheiche n'oge niile kwa ụbọchị nke mere e ji asị na ''Ndị uweojii bụ enyi gị"

Mana ọtụtụ oge ndị mmadụ na-ahụta mmekọrịta ha na ndị uweojii dịka ihe ịtụ egwu n'ihi etu ụfọdụ n'ime ha ji akpa agwa.

N'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, ha na ndị mmadụ na-enwe mmekọrịta dị iche iche n'oge niile kwa ụbọchị nke mere e ji asị na ''Ndị uweojii bụ enyi gị"

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụ nke a mere ndị isi ụweojii jiri depụta usoro ndị mmadụ kwesiri ibu n'obi dịka ha na ndị uweojii na-enwe mmekọrịta.

N'ozi a ha wepụtara n'akara twitter ha kwuru na mgbe ọbụla ndị uweojii nwuchiri gị maọbụ kpọọ gị oku, na ọ bụ ohere i nwere iji mara ndị uweojii nke ọma.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ihe ndị i kwesiri ịma banyere mmekọrịta gị na ndị uweojii

  • Were obi ọcha soro ndị uweojii gaa n'ụlọọrụ ha. Nke a na-egosi na onweghi ihe ọbụla ị na-ezo ezo nye ha. Ọ ga-eme ka ha ghara iji aka ike anwụchi gị.
Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

  • Abụla ọgbatauhie nye ndị uweojii mgbe ọbụla ha bịara ịnwụchi mmadụ, kpachara anya na onwereike ị maghị ihe onye ahụ mere eji chọrọ ịnwụchi ya.
  • Ejila ekwe ntị gị zaa oku ma ọ bụ kpọọ mmadụ n'ụzọ na-ezighi ezi n'oge ha na-anwụchi gị.
  • I nwereike ịbuzọ rịọ ka i nyocha onye uweojii ahụ tupu o nyochaa gị, iji kachapụ ụjọ na o nwereike itinyere ihe ọjọọ ga-chịpụta gị ụkwụ n'ama.
Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

  • Tupu onye uweojii ahụ a na-enyocha gị, jụọ ya maka akwụkwọ nyere ya ikike inyocha gị bụ 'Search Warrant' na bekee ma burukwa n'obi na ọ bụghị oge niile ka ọ ga-eji ikike a tupu e nyocha gị.
  • Were nwayọọ rịọ ndị uweojii ka ị gwa nwanne gị, enyi gị maọbụ ọkaiwu gị ebe ị nọ ma ha nwụchie gị, ka ezinaụlọ gị ghara ị chọ gị achọ.
  • Jụọkwa ndị uweojii maka ikike ha nwere iji nwụchie gị nke bụ 'Warrant of Arrest' na bekee. Kama ọ bụghị oge niile ka ha ga-eji nke a dịka iwu jiri kwuo.
Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

  • Gbaa mbọ mee ka ndị uweojii mara maka ọnọdụ ahụike gị ma ha nwụchie gị, ka a mara ma ị chọrọ nlekọta ahụike.
  • Ihe ndị a na ndị ọzọ ga-enyere ndị mmadụ aka ị mata ikike ha nwere nakwa nke ruru ha mgbe ọbụla ha dabara n'aka ndị uweojii.
Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: