Electricity workers: Ha gbara abụbụ ọrụ n'Enugu nakwa steeti niile

Aha onyonyo, Electricity workers: Ha gbara abụbụ ọrụ n'Enugu nakwa steeti niile

Abụbọ ọrụ ndị TUC mere na steeti ndị ọzọ amịtaghị mkpụrụ dịka ndị ntaakụkọ BBC si chọpụta.

N'ụlọọrụ TCN dị na Abuja, ndị ọrụ pụtara kwụsị ngagharịwe ndị ndị TUC na-eme ma kwuo na ha na-emebisiri ha ihe.

Na Rivers steeti, onyeisi ndị TCN bụ Austin Jonah kwuru na ha nweteghị ozi ngagharịwe a n'oge mana ha ga-ebido ụbọchị Tusde na-abịanụ.

Cheta na Otu jikọrọ ndị ọrụ na Naijiria bụ TUC nke Enugwu agbachiela ụlọ ọrụ n'enye ọkụ latrik bụ "Transmission Company of Naijiria" (TCN) n'aha ịchafụ.

Latrịk
Nkọwa foto, Ndị ọru bukakwụkwọ edepụtara iwe ha, wee na-agagharị n'gburugburu.

Onye isi TUC Enugwu bụ Comrade Igbokwe Chukwuma Igbokwe du ndị ọrụ TCN were zọchịe n'ụlọ ọrụ ahụ ime ngagharị iwe maka mmegbu ha sịrị na onye isi kachasị ụlọ ọrụ ahụ na-emegbu ndị ọrụ.

Ndị ọrụ ahụ ji iwe mechie ụzọ esi aba na ya bụ ụlọ ọrụ, buru akwụkwọ ha depụtara iwe ha ma na-agụ egwu ka obi dị ha.

Igbokwe kwuru na GU Mohammed bụ onye isi ụlọ ọrụ ahụ na-ejị ndị ọrụ ụgwọ, na-enye ndị mmadụ akwụkwọ nkọwa ajọ agwa etu osiri masị ya.

Latrịk
Nkọwa foto, Ndị otu TUC depụtara mkpa ha chọrọ ka ndị isi ụlọọrụ TCN mere ha

Ha kwukwara na o na-ebutu onye ọbụla gosiri iwe ya n'ọkwa na-eleghị anya n'azụ.

Otu onye ụlọ ọrụ TCN so na-eme ngagharị iwe bụ Ogbonna Hillary kwara arịrị na onye isi ha bụ UG Mohammed ga alarịrị n'ọrụ n'ihi na ọchịchị ya bụ Eze onye agwalam.

Latrịk
Nkọwa foto, Ndị ọru bukakwụkwọ edepụtara iwe ha, wee na-agagharị n'gburugburu.

Ogbonna kwuru na orubere ha niile bụ nke akwụsịrị ịkwụ ha n'ịhị na ha jụrụ ndị isi ajụjụ.

Latrịk

Ndị ọrụ ahụ boro Mohammed ebubo na akụrụngwa latrik karịrị akpati puku asaa na ụma gọmenti tụlatata n'afọ gara aga bụ nke Mohammed agwaghị ha ka osiri gaa rue tata.

Ode akwụkwọ ndị TUC Enugwu bụ Ben Asogwa kwukwara na ha agaghị ekwe ka mmadụ banye ma ọ bụ pụọ na ụlọ ọrụ ahụ tata ganye na gọmentị emere ha ebum n'obi ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: