Igbo Presidency: Onyeisiala Igbo ga-abụ ọpụrụiche - Nwobodo

Ebe foto si, Amarachi Atama
Okwu gbasara ndị Igbo ichi Naịjirịa ka na-ekpo ọkụ.
Aka chiburu Anambra steeti bụ Jim Nwobodo kwuru na ihe dị iche ga-adị ma onye Igbo chịa Naịjirịa.
Nwobodo rịrọrọ ndị Igbo ka ha jịkọọ aka ma na-ekwusike na ndị Igbo ga-ahọpụtali onyeisiala Naịjirịa na-enweghị esemokwu ọbụla.
Ọ rịọrọ ndị ọkaikpe ka ha gaa n'ihu na-ekpe ikpe kwụ ọtọ makana ọ bụ naanị ha bụ ngalaba na-ejikọ mba Naịjirịa.
Nwobodo kwuru nke a n'emume ncheta ụbọchị ọmụmụ ya nke afọ iri asaa na itoolu emere n'Enugu.






