2023 Presidency: Naijirịa ga-anọ n'ọchịchịrị maọbụrụ na onye Igbo achịghị - Ohaneze

Ebe foto si, BBC/PDP Official Facebook page
Ọtụtụ mmadụ ka na-ekwu maka akụkọ pụtara n'elu soshal midia na Yemi Osinbajo kwuru na oche onyeisiala ga-agara ndị Yoruba n'afọ 2023.
Ọ nụ na-ekwuchitere otu Ohaneze ndị Igbo bụ Uche Okpaga kwuru na Naijirịa ga anọ n'isi maọbụrụ na onye Igbo achịghị.
Ọ gụpụtara ndị dịka Chukwuma Soludo(Onye bụbụ gọvanọ CBN) ,Onyebuchi Chukwu(Onye bụbụ minista na-ahụ maka ahụike) ,Dr Ngozi Okonjo-Iweala(onye bụbụ minista na-ahụ maka nhazi akụ na ụba Naịjirịa, Dora Akunyili(Onye nwurulanụ) nakwa ihe ha mere Naijirịa mgbe ha nwere ife ala nna ha.
O kwuru na ọ ga-agụta ole ghara ole.
Okpaga kwuru na ndị Igbo ga-achị mgbe Chukwu chọrọ ka ọ bụrụ agbanyeghị ihe mmadụ na-elo.
Ihe PDP kwuru
Onyeisioche PDP bụ Uche Secondus kwuru na ndị APC na-eme ihe ọ bụla iji wee nweta ihu ụmụ Naijirịa .
O kwuru na okwu a dịka nwaanyị na-aghọrị ụmụ nwoke karịrị otụ na ọ ga-alụ ha niile.
Secondus kwuru na ọgbagọjuru ya anya etu onye dịka Yemi Osinbajo ga-esi na-atụ asị makana onweghị pati APC ga-esi nye mpaghara abụọ oche onyeisiala n'afọ 2018.
N'ọnụ ya, "minista na-ahụ maka ọkụ latrịk na ụlọ obibi bụ Babatunde Fashola kwuru na apc ga-enye onye Yoruba akwụkwọ ikike izọ oche onyeisiala mana odee akwụkwọ gọọmenti etiti kwuru na ọ bụ
asị .Kedụzi ihe ha ji atụrụ asị maka ndọrọndọrọ ọchịchị?"
Afenifere site n'ọnụ onye na-ekwuchitere ha ọnụ bụ Yinka Odumakin, mgbe ọ na-asa onye natakụkọ ajụjụ jụrụ ihe ndị Yoruba ritegoro n'aka Osinbajo kamgbe ọ nọ n'ọchịchị.
Odumakin kwuru na osote onyeisiala apinyụọla ihe niile jịkọtara ndị Yoruba kamgbe ọ banyere ọchịchị.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









