Original jamb results: Nwafọ Imo dị afọ 15 kachasị mee nke ọma n'ule Jamb

Ebe foto si, Jamb/Facebook
Ụlọọrụ Jamb ewepụla aha mmadụ atọ kachasị mee nke ọma n'ule eji aba Mahadum nke afọ,
Ndị a gụnyere Ezenala Ekene Franlin bụ onye Imo Steeti dị afọ iri na ise, o nwere akara dị 347, ọ họrọ Mahadum Legọs dịka nke mbụ ya.
Osote ya bụ Igbam Emmanuel Chidiebere bụ onye Abia Steeti dị afọ iri na isii, nwetere akara dị 346 ma họrọ kwa Mahadum Legọs dịka nke mbụ ya.
Nke atọ bụ Olowu Isaac Olamilekan bụ onye Osun Steeti, nwetere akara 345, Mahadum ọ họrọ bụ Obafemi Awolowo.
Onye na-ahụ maka idebanye aha n'ule a bụ Ishaq Oloyede kwuru na onye nke mbụ na nke abụọ nwereike ha agaghị aba Mahadum n'afọ a n'ihi afọ ole ha gbara.

Ebe foto si, Jamb/webste
Ule eji aba n'agụmaakwụkwọ mahadum nke afọ 2019 bụ Jamb apụtala taa dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ule a si kwuo.
Onye na-ahụ maka idebanye aha n'ule ahụ bụ ọkanmụta Ishaq Oloyede bere akwa dịka ọ na-ewepụta ozi banyere mpụtara ule Jamb 2019 bụ nke elere n'izuụka ole na ole gara aga.
O kwuru na isi akwa ya bụ n'ihi oke nrụrụaka jupụtara n'ule nke afọ a n'ọgbọ dị iche iche elere ule a na Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images
Oleyede kwuru na ndị ọrụ nchekwa dị iche iche gụnyere ndị 'Force Intelligence Bureau (FIB)' nyere ha aka n'ebe ọ dị ukwuu i nwuchi ndị aka ha dị na nrụrụaka ule a.
O kwuru na ha wepụtara mpụtara ule dị otu nde na ọma asaa (1,792,719) ebe ha kpachiri mpụtara ule ruru puku iri atọ na anọ (34,120) bụ ndị a na-enyocha maka nrụrụaka.
Ị chọrọ ị mata ihe nwere n'ule Jamb were ekentị gị ziga ozi 'RESULT' n'akara obere a 55019.
Sịnetọ Ned Nwoko enwetala asambodo n'aka Inec

Ebe foto si, Ned-Nwoko Yes-forSenate/Facebook
Ụlọọrụ Inec anapụla Peter Nwaoboshi asambodo Sịnetọ ma nye ya Ned Nwoko dịka onye ga-anọchite anya mpaghara Delta North n'ụlọomeiwu.
Nke a na-abịa dịka ụlọikpe nọ n'Abuja na Wednezde chụrụ Peter Nwaoboshi n'ọkwa ahụ n'ihi ihe mgbagwoju anya dị na ntuliaka ime ụlọ PDP mere.
N'ofesi

Ebe foto si, AFP
Ndị oji egbe awakpoola ụlọ oriri 5 star dị na Balochistan nke mba Pakista bụ ebe ndị mba China hiwere ọtụtụ azụmaahịa.
E gbuola otu onye ọrụ nchekwa dịka otu kpọrọ onwe ha Balochisten Liberation Army sị n'aka ha dị na mwakpo a.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Onye nchịkọta otu egwu bọọlụ Juventus bụ Massimilliano Allegri akatọọla ozi na-efegharị na ọ chọrọ ịhapụ Juventus
Allegri kwuru kama na ọ ga-ezute onyeisi otu ahụ bụ Andrea Agnelli n'izuụka na-abịaka na mkparịtaụka.
Nkeji
Ihe nkiri
Kedu ebe Kano kwụ akwụ?

Ebe foto si, Kano state/twitter
Otu ụlọikpe kachasị na Kano steeti agwaala gọọmentị steeti ahụ ha kwụrụ ebe ha nọ n'ịkewapụta ala eze Emir anọ ọzọ n'ime nke dị adị.
Cheta na aka na-achị Kano steeti bụ Abdullahi Ganduje binyere aka n'akwụkwọ iwu ga-ekewapụta ala eze ọhụrụ anọ n'ime nke dị adị nke ndị mmadụ katọrọ.
Unu a na-ege ntị?

Ebe foto si, Enfield Council
Maka na e meela nwa ada Igbo ọzọ Mayor na okpuruọchịchị Einfield nke dị n'obodo London mba Briten.
Kate Anolue bụ onye Nanka ga-eso Cryril Ezeajụghị bụrụ ndị ojii mbụ a ga-eme Mayor na Kasul ha.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Gernot Rohr bụ aka na-achịkọta otu Super Eagles chị aka n'obi ugbua gbara ahụike Odion Ighalo nke Naịjirịa merụrụ ahụ n'ụbọchị Fraide.
Ọ bụ maka na a na-atụ anya na Ighalo ga-eso Naịjirịa mme njem ịbulata iko mba Afrịka n'afọ a.










