Babatunde Fashola sị na Naịjirịa na ayọrịbazi egwu maka ọkụ latrik

Ebe foto si, Getty Images
Minista na-ahụ maka ọkụ, ọrụ na ụlọ bụ Babatunde Fashola kwuru na ọkụ latrik a na-emepụta na Naịjirịa agbagotela ruo megawatt puku asaa.
Fashola kwuru nke a na Kalaba, isi obodo Kros Riva steeti ụnyaahụ.
Fashola nọ na Kalaba ebe ndị isi ọrụ na ngalaba ọ na-achị na-eme nzukọ.
O kwuru na agbanyeghi na ọrụ fọdụrụ ka nkụ, ngalaba ya agbanyela ọnọdụ ọkụ latrik na Naịjirịa karịa etu ọ dị mgbe ha malitere ọru n'afọ 2015.

Ebe foto si, Reuters
"Afọ ato gara aga, akukọ bụ na mmepụta ọkụ latrik bụ nnukwu nsogbu anyị nwere na Naijirịa. Mgbe ahụ, ndị na-eke ọkụ na-ekwu na ha enweghị nke ha ga-ekenye ụmụ Naịjirịa.
"Mgbe ahụ, anyị na-eke "megawatt" 2,690 nye ndị Naịjirịa, mana akụkọ ahụ agbanwela. Ihe anyị nwere ike ugbua bụ megawat 5,222, nke bụ nke kachasị kamgbe Naịjirịa pụtara.
"Ugbua, ihe a na-emepụta bụ megawatt 7000, ma na-ekekwa 7000. Nsogbu ka dịkwa, mana anyi ga-ekwu na anyị na-aga n'ihu.






