A gbagbuola ndị na-agbanwe ego mmadụ anọ na Port Harcourt

Oroazi dị na Pọtakọt
Nkọwa foto, Oroazi dị na Pọtakọt bú ebe ndí na-agbanwe ego na-anó

Ndị ntorobịa anọ aghọọla ozu ka a ghachara mgbọ n'ime obodo Oroazi dị n'okpuru ọchịchị Obi Akpor dị na Rivas State.

Sherif Musbau Ibrahim bụ onye isi otu jikọrọ ndị ugwu na-azụ ahịa na Rivas steeti a kpọrọ 'Northern Traders Association of Nigeria', gwara BBC na mmadụ anọ n'ime ndị otu ha nwụrụ na mmekpa ahụ ndị gụnyere osote onyeisi ha bụ Yusuf Abubakar.

O kwukwara na otu nwata nwoke ya na ya na-azụkọ ahịa aha ya bụ Rabiu Damala so na ndị a gbagburu.

Ndị ọzọ gụnyere Adamu Tukur nakwa Sadiq Yusuf.

Sherif kwuru "Mmadụ anọ ndị otu anyị nwụnarịrị anyị, mana anyị anaghị ebo onye ọbụla ebubo kama anyị hapụrụ Chineke ihe niile. Anyị na-ekpe ekpere ka mkpụrụobi ha zuru ike na ndokwa."

Sherif gara n'ihu kwuo na e bulala ha Bauchi maka olili ozu.

Akụkọ kwuru na mmadụ isii nọ n'ihu ukwu osisi Oroazi na-ezu ike oge ndị bu egbe wakporo gbawa ha egbe nke gburu mmadụ anọ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Nnamdi Omoni, kwuru na ihe mere n'ezie ma kwukwa na ha na-enyocha ya.

Akụkọ ga-amasị gị