Sokoto: Ụgbọ okpukpu egbuola mmadụ 21

Ebe foto si, Getty Images
Otu ụgbọ mmiri njem ekpuola na mmiri Gandi dị na Sokoto bụ mpaghara ugwu nke Naịjirịa ma gbuo ihe ruru mmadụ iri abụọ na otu.
BBC chọpụtara na ndị nọ n'ime ụgbọ mmiri ahụ bụ naanị ụmụnwaanyị dị iri na asaa na ụmụaka dị anọ.
Ha si n'obodo Gandi na-aga obodo ha bụ Gandi-Kari mgbe ụgbọ mmiri obere ha ji kpuru na mmiri, ebe mmadụ iri gbanahụrụ ọnwụ.
Ndị a nwụrụ bụ ndị na-alọta site n'ọsọ ndụ ha gbara maka ndị na-eyi ndụ egwu batara obodo ha n'ọnwa gara aga.
Amatabeghi ihe butere mkpugharị ụgbọ mmiri ahụ mana nke a bụ ihe na-emekarị n'ihi oke ibu.






