NYSC: Ụmụ Naijiria achọghị ka e jiri azịza zafuo ebubo eboro Adeosun

Ebe foto si, Getty Images
Otu na-agba mbọ maka ikike dịrị onye a kpọrọ 'Socio-Economic Rights and Accountability Project'(SERAP) abọlitela okwu gbasara Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Kemi Adeosu ọzọ.
Izu ole na ole gara aga, akụkọ pụtara na Adeosun ejighị otu afọ fee ala Naijiria dịka iwu siri kwuo, kama ọ gara kpụọ asambodo adigboroja nke na-ekwu na ọ karịala afọ eji eme ya.
Mana taa bụ Tọọsde, Serap nyere ngalaba gọọment na-ahụ maka iji otu afọ fee ala Naijiria bụ NYSC n'aha ịchafụ abali asaa iwepụta akwụkwọ na ozi na-egosi nke bụ eziokwu n'ebubo eboro Adeosun na ọ kpụrụ asambodo adịgboroja.
N'ozi Serap wepụtara na Twitter, ha kwuru na nkịtị ndị isi NYSC gbara n'okwu ahụ nwere ike igosi na o nwere mpụ e mere ma bute ịtụ aka na ha nwere ihe ha na-ezo banyere ihe mere.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Lee ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka ya:
Ogbuehi Victor kwuru na ọgala abali 25 kemgbe ụlọakụkọ Premium Times wepụtara akụkọ gbara ama maka Adeosun na asambodo adịgboroja mana onyeisiala Buhari, EFCC nakwa ndị uweojii mere, ebe APC na-alụso Saraki ọgụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Nafiu T na Ben Tuyi jụrụ afọ ole ọ ga-ewe NYSC ịlebanye anya n'akwụkwọ ha ịchọpụta maka asambodo akụrụ akụ nke Kemi Adeosun?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3

End of X post, 4
Ụfọdụ na-akpọ oku ka e mee ngagharịiwe iti mkpu ka Adeosun rida n'ọkwa minista maka ebubo ịkpụ asambodo adigboroja.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5