Naịjirịa ga-ere akụnaụba ọha iji mezuo ego bọjetị 2018

Ebe foto si, AFP
Naịjirịa na-ele anya na ọ ga-erete ijeri naira 400 na akụnụba ọha nke ga-enye aka tinye ego na bojeti nke 2019, onyeisi ngalaba na-ahụ maka akụnụba ọha kwuru.
Alex Okoh, onyeisi ngalaba ahụ akpọrọ "Bureau of Public Enterprises" n'asụsụ bekee, kwuru na gọọmentị ahazịela usoro atụmatụ ha ga-eji ree akụnụba gọọmenti, bụ nke ha jiri bụte ego n'aka ulọakụ mba ụwa.
Ego a ha bụtere ga-abanye ibulite nkekọrịta ọkụ latrịk, bụ nke ha sị adịghị eme ọfụma.
Na mkparịtaụka Okoh na ụlọ ntaakụkọ Reuters nwere na izuụka gara aga, ọ gwara ha na gọọmentị Naịjirịa nwere atụmatụ ire maọbụ inye ụlọ ọrụ ndị nkịtị ihe dị ka ọgbọ egwuregwu na ụlọ ọkụ latrịk.
Ndị Reuters nwere na gọọmentị gwakara ha na achọrọ iresi ọha ụfọdụ oke gọọmentị nwere na ụlọọrụ Nigerian Reinsurance Company n'ọnwa Novemba nke afọ a.
N'afọ 2013, Naịjirịa bidoro ire akụnụba ọkụ latrịk ya n'uche na ọ ga-enye aka ime ka me ka ọkụ na-adị karịa ka ọ na-adị na mbụ ma webata ego si mba ofesi, mana onweghị otu n'ime ihe mere.
Okoh kwuru na ngalaba ọkụ latrịk so n'ime ngalaba 37 ọha erere eritebeghị uru ekwesiri na ha, mana o kwughi akụnụba ole gọọmentị rere.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na Naịjirịa alabatala ego ruru ijere dọla 7.8 site n'ake ndị mba ofesi ji ego achụ ego.
Buhari ebinyebeghị aka n'akwụkwọ eji eke ego nke 2018, bụ nke ga-eme ya iwu.
Bọjetị Naịjirịa riri elu karịcha kemgbe Buhari batala ọchịchị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










