Chekwas Okorie agwala gọọmentị ka o kwanyere Humphrey Nwosu ugwu

Abiola na Juun 12

Ebe foto si, Chekwas Okorie/facebook

Nkọwa foto, Chekwa bụ onyeisi United Progressive Party zọbụrụ ọkwa onyeisiala Naịjirịa

Nwafọ Igbo bụ onye ama ama na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Chekwas Okorie etinyela ọnụ n'okwụ ndị kwuru na nkwanye ugwu na nturu ugo nke awọrọ Humphrey Nwosu dịka mmegbu a na-emegbu ndị Igbo.

Ọ sị na ntuliaka aka ahụ Humphry Nwosu mere bụ nke ụwa nịịle kwetere na ọ bụ ọkacha akacha na ntụlịaka emegoro na Naịjirịa kwesiri ị nweta nkwanye ugwu pụrụ iche.

Ọ sị na Nwosu bụ nwafọ Igbo nwere obisiike na ikpe nkwumọtọ na-enweghị ogbo, agbanyeghị na ọ nọ ọdụ ka ndụ ya adabere adabere mgbe ahụ dịka ndị amị sịrị sochie ya azụ.

Na onu ya, onweghị onye kwesiri nturu ugo karịa nwaamadị mere otu a.

Ọ sị na emeghị ya bụ nwata ka emere ibe ya dịke Igbo kwuru na okwu.

Okorie sị na "Nwanne anyị bụ Prof. Humphrey Nwosu kwesiri ịkwanyere ugwu pụrụ iche ebe ọ bụ na-ometula ndị ọchịchị aka n'obi icheta ndị kwụsiri ike n'ezi okwu".

Ọ sị na nke a ga-eme ka ọchịchị onye kwuo uche ya gwudosie ike na Naịjirịa agbanyeghị mbọ nịịle ndị ajọọ mmadụ gbara megide ya bụ usoro ọchịchị.

Ọ mere ka anyị cheta na ọ dịka achọwara ya bụ onye ọkammụta achọ mgbe ahụ mana nke a emeghị ka ọ laa azụ na-eziokwu ikwuputa na ọbụ MKO Abiola bụ onye nwere mmeri na ya bụ ndọrọndọrọ ọchịchị.

N'ihi ya, o kwesiri ị kwanyere ugwu n'ụzọ pụrụ iche.

Ọkorie sị na-ekwesilarị ịme nke a kemgbe n'ihe na-aka jị ihe ahụ ọmere amatụ ruo taa, "onwebeghị onye mere ihe yiri ya kemgbe ahụ".

Ọkwusikwara ike na ọbụrụ na-akwanyeghịrị ya ugwua na "ọ bụ mmegide maka na ọ bụ onye Igbo".

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ