Lee ihe ise nwere ike ịnọchi plastik na be gị

Ebe a na-ekpofu ahịhịa

Ebe foto si, Eti-Inyene Godwin

Nkọwa foto, Na Maachị 2017 gọọmentị Lagos steetị machịrị ebe a na-ekpofu ahịhịa olusosun maka awụrụ na-apụta na ebe a

Taa bụ ụbọchị ncheta gburugburu obibi nke mba ụwa, nke a kpọrọ 'World Environment Day' na bekee.

Ị ma na ndị uweojii ga-anwụchị gị ma tụba gị na mkpọrọ kpamkpam ma ọ bụrụ na i jiri nailọn(nylon) n'aka na Nairobi,isiobodo Kenya?

Ị makwa na gọọmentị ga-ada gị nha ma ọ bụrụ na i ijiri nailọn bata n'ala Rwanda?

Kedu maka gị onwe gị? I chere na ị ga-anọnwụ otu ụbọchị na-ejighị plastik mee ihe ọbụla?

Ajụjụ ndị a dị ezigbo mkpa n'ihi na plastik na-ebute nnukwu nsogbu na gburugburu obibi na mba ụwa niile.

Plastik na-afachi ọwa mmiri sị aga ma na-ebute nnukwu ọrịa ma ọ bụrụ na ọ ba gị n'ahụ.

Ị ma na chingum (Chewing gum) were rubber n'ime ya, ihe a sokwa n'ihe ejiri eme plastik.

Ebe a na-ekpofu ahịhịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ihe bụ nsogbu dị n'uwa niile

Dọkịnta Ikechukwu Mgbolu gwara BBC Igbo na-agbanyeghị n'ọrịa dị na Naịjirịa abụghị maka plastik banyere n'ime ahụ mmadụ, ọ dị ezigbo mkpa ịkwụsi ike n'ọrịa dịka iba (malaria) na afọ ọsịsa (cholera) ka nkụ na Naịjirịa maka na plastik fachiri ebe mmiri si aga, ma ọ bụ na-emebi mmịrị ndị mmadụ na-aṅụ n'ime obodo dị iche iche.

Cheta kwa ihe na-eme na mpaghara Naija-Delta, bụbụ ebe ọ kachasị njọ bụ nsogbu mmebi gburugburu obibi.

Gịnị bụ ihe ndị ọzọ were ike ịnọchi plastik?

N'ime akụkọ a, anyị ga kọwara gị ihe ndị ọzọ ị nwere ike iji nọchie anya plastik.

  • Akwụkwọ (Paper): Akwụkwọ dị mma maka na o nweghị ihe ọjọọ ọ na-eme gburugburu obibi.
  • Ihe mere akwụkwọ ji dịkwa mma bụ na ọ baa na mmiri ọ na-agbazee.
  • Akwa: Ndị bekee kpọrọ ya 'Wash Cloth'. Akwa nke a bu nke e ji owu( cotton) were mebe.
  • Tishu: Ihe a bụ akwụkwọ ọcha eji ehiche ihe ọbụla mana i nwere ike iji ya wee mere ihe ọbụla akpa plastik na-eme.
  • Akwụkwọ ndụ: Dọkịnta Mgbolu dọrọ aka na ntị na iji platik na-esi ihe were ike inye nsogbu n'ime ahụ. O kwuru na akwụkwọ ndụ bụ nke kachasị mma.
  • Nkata: Nke a bụ ihe ọzọ i nwere ike iji wee nọchie plastik na be gi.

Akụkọ ga-amasị gị: