Jamb 2019 result: Ime nkeọma n'ule Jamb abụghị ịba Mahadum - Mahadum Lagos

Akụkọ dị mkpa

Anyị ga-anwale Ekene tupu a nabata ya - Unilag

Mahadum Lagos

Ebe foto si, Getty Images

Mahadum Lagos ekwuola na Ekene Franklin kachasị nwete akara n'ule Jamb nke afọ a ga-ebụzọ lee ule nke ụlọakwụkwọ ha na-ahazi tupu ekwuo okwu ị nabata ya.

Ọnụ na-ekwuru Mahadum a bụ Salau Tajudeen kwuru na agbanyeghi na o nwere akara kachasị n'ule Jamb apụtaghị na ọ ga-eme nke ọma n'ulo ha.

O kwuru na mmadụ nwereike ime nke ọma n'ule Jamb ma dakasịa n'ụle ndị ọzọ.

Cheta na Ekene bụ nwafọ Imo Steeti gbara afọ iri na ise nwere akara dị 347 n'ule Jamb nke mere ya onye kachasị mee nke ọma n'ule a.

Kapúsú edo

Ebe foto si, Getty Images

Mohammed Salah, Pierre-Emerick Aubameyang na Sadio Mane ga-ekekọrịta okpueze 'Golden Boot' n'asọmpị Premier League

Ha ritere nke a n'ihi ọkpụ goolu iri abụo na abụọ ha gbara n'asọmpị ahụ.

Mohammed Salah na Sadio Mane na-agbara Liverpool bọọlụ ebe Aubameyang na-agbara Arsenal.

Ụbọchị onyekwuouche ya ka bụ 29 Mee

Garba shehu and Buhari

Ebe foto si, Garba Shehu

Nkọwa foto, Garba Shehu na one of di tok-tok pipo of President Buhari

Onye enyemaka pụrụcihe onyeisiala Naịjirịa bụ Garba Shehu agbaghala okwu na-efegharị na gọọmentị etiti na-akwado ịgbanwe ụbọchị onyekwuouche ya ruo Juun 12.

Shehu kwuru na agba nke mbụ nke onyeisiala na-agwụcha n'ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Mee.

Gịnị mere onyeisiala Igbo?

Ndị nze na ọzọ

Ebe foto si, Amarachi Atama

Aka chịburu Anambra steeti bụ Jim Nwobodo etinyela onụ n'okwu gbasara onye Igbo ịbụ onyeisiala Naịjirịa

O kwuru na ihe dị iche ga-adị ma onye Igbo rigo n'ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

Na mba ofesi

Ụlọorịrị na Burkina Faso a gbara ọkụ na mwakpo 2016

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, A wakpola Burkina Faso mbụ n'afọ 2016

Ndị omekome na mba Burkina Faso abaala n'imụlọụka gbagbuo mmadụ isii gụnyere ụkọchụkwụ na-aka ụka ebe ahụ.

Ha gbakwara ụlọụka ahụ na ụlọ ndị ọzọ dị ya nso ọkụ tupu ndị ahụ ruru mmadụ iri atọ e si ebe ahụ pụọ

Gee Nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri taa

Aha onyonyo, Nedu Wazobia 1.