Lee ụmụnne abụọ na-eji akpụ emepụta ọkụ latrik na Gana

Ụmụnne abụọ nọ na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Gana egosila ụwa na ị ga-ejinwu akpụ mepụta ọkụ latrik.
James na Kwesi Ansah mepụtara ihe ha kpọrọ 'JK2 table power' site n'ihe dịka plastiki, osisi nakwa waya si na kọpa.
Akpụ bụ ihe oriri a ma ama si na mpaghara ọdịda-anyanwụ Afrịka, nke ndị mmadụ na-eji emepụta nri dị iche iche.
Maka na ndị na-akọ ugbo na-emepụta akpụ karịrị ihe ndị mmadụ na-eri, ọtụtụ akpụ na-emebi.
Mana site n'ihe a ụmụnne abụọ a rụpụtara, ndị mmadụ ga-enwe ike iji akpụ mebiri emebi maọbụ ihe a tufuru n'ime akpụ wee mee ka ekwentị gị nweta ọkụ, mee ka ọkụ latrik nwuo nakwa tinye ọkụ na redio na ihe ndị ọzọ.

James na Kwesi kwuru na ọ bụrụ na gọọmentị maọbụ ndị na abụghị ndị ọrụ gọọmentị kwado ha, na ha ga-enwe ike ịmepụta ọkụ latrik ga-enye ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ, ime obodo na ndị niile na-enweghị ọkụ latrik na Gana ọkụ.








