Ajegunle Killing: Ndị uweojii agbagbuola onye ọzọ na Lagos

Ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ mmadu na-akato oke ogbugbu mmadu ndị uweojii na-eme
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Bala Elkana sị na aka akparala ndị uweojii a na-eche n'aka dị n'ogbugbu nwa agbọghọbịa n'Ajegunle dị na Legọs.

N'akwụkwọ mgbasa ọzị o binyere aka, Elkana sị na onyeisi ndi uweojii na Legọs bụ Zubairu Muazu nyere iwu ka anwụchịkọ ndi uweojii aka ha dị na mgbagbu mmadụ metụtara Ada Ifeanyị di afọ iri abụọ nakwa Emmanuel Akomafuwa.

Ndi uweojii si na ihe mere n'utụtụ Satọde bu ụbọchi nke iri an ato nke ọnwa Epreelu, n'ebe elekere asaa.

Akwụkwọ mgasa ozi a sị: "Eburu ndị a ihe metụtara gawa ụlọ ọgwụ ebe ekpebiri na Ada Ifeanyi anwụọla. Emmanuel Ifeanyi no ebe ahụ anata ọgwụgọ."

Ndi uweojii aka ji bụ: Inspector Adamu Usman, Sergeant Adeyeye Adeoye, Sergeant Kashim Tijani, Sergeant Lucky Akigbe na Sergeant Paul Adeoye. Inspector Dania Ojo, bu onye gbapụrụ ọsọ mgbe ihe a mere bụ onye a na-achọzị achọ."

Cheta na akụkọ na soshal midikọwara etu ndị uweojii ji gbabuo nwa agbọghobịa ma merụrụọ nwoke ya na ya so ezigbote ahụ n'abalị ụnyaahụ.

Onye ọnu na-eru n'okwu n'ihe banyere mmegide ndị uweojii eji akara Twitter @segalink mara dere na ndị uweojii anwụchiela ndi otu ha kpara ike a.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Nke a na-abịa dika onye oti egwu aha ya bụ Rugged Man tiri mkpu sị ka ekpee onye ọbụla gburu onye aka ya di ọcha ikpe ọnwụ.

Rugged Man dere ihe a n'akara Twitter bụ @RuggeddyBaba

Oke ogbugbu ndị mmadụ site na aka ndị uweojii bụ ihe ọtụtụ mmadu na-akatọ.

Na nsonso a, ha gbagburu nwoke aha ya bụ Kolade Johnson na otu Legọs a kwa, nke mere ụtụtụ mmaọ̄ụ jiri kwalitekwa atụmatụ #EndSARS.

Lee ihe otu onye dabanyere n'aka ndị SARS gwara BBC Igbo.

Aha onyonyo, Okwu Immanuel James Ibe-Anyanwu maka nwakpo SARS wakporo ya.