Nsibidi Writing: Akara ochie e jiri mara ndị Igbo

Nsibidi
    • Onye dere ya, Chigozie Ohaka
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service

Ọtụtụ mmadụ amaghị na ndị Igbo nwere ederede ha ji agbasa ozi ma na-edekorịta ihe mere tupu ndị ọcha amalite inwe mkpụrụ edemede nke ha.

Ndị Igbo kpọrọ nke ha Nsibidi, Nchibidi ma ọ bụ Nsibiri. Mana aha akacha akpọ ya bụ Nsibidi.

Ọkammụta Chigozie Nnabuihe, bụ onye nkuzi na mahadum Legos kọwara na dịka ụfodụ mmadụ siri na-eche, Nsibidi abụghị mkpụrụ edemede, kama ọ bụ ihe esere ese ndị mgbe ochie jiri agbasa ozi.

Kedu etu Nsibidi siri bido?

Ọnweghị onye ma etu Nsibidi siri bido n'ihi na ọ bụ ndị otu nzuzo dika Ekpe na Ọkọnkọ nwe ya, mana otu ihe dooro anya bụ na ọ tọrọ akara edeme ndị Ijipt, nke Bekee kpọrọ "Heliographics", dịka Okammụta Nnnabuihe kwuru.

N'akụko ifo ụfọdụ, ọ bụ Utobo ka e si kuziri ndị Igbo Nsibidi.

Ihe eji Nsibidi eme

Nsibidi
  • Ndị Igbo na-eji Nsibidi ezisa ozi
  • Eji Nsibidi eme omenala pụrụ iche
  • A bịa n'ala igbo, ndị na ekpe ikpe maọbụ na-ahụ maka ọchịchị na abukarị ndị otu nzuzo dị ka Ọkonkọ, Ekpe na Mmanwụ, a na-eche na ha na-eji Nsibidi edekọrita mpụta ikpe
  • A na-ejikwa Nsibidi achọ ahụaja, osisi na ihe ndị ọzọ mma.

Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ eji Nsibidi mara

Ọ bụ n'ala Igbo na ụfodụ mpahara steeti Cross River, Rivers na Akwa Ibom ka ndị ji Nsibidi mee ederede bi mgbe ochie.

Ebe ọbụla enwere ọkọnkọ, ekpe ma ọ bụ mmanwu n'ala Igbo na ufodị mba gbara Igbo gburugburu, ị ga enweta Nsibidi.

Mmọnwụ Coal Camp
Nkọwa foto, Ndị nọ n'otu Mmanwụ, Ekpe na Okọnkọ bụ ndị ma maka Nsibidi

Gịnị mere Nsibidi jiri laa?

Akara Nsibidi karịrị otu puku mana n'ihi na a na-ede ya na ukwu osisi, ahụ aja, maọbụ a kanye ya n'ahu mmadu, ọtụtụ akara Nsibidi efuola.

Mana ụfọdị ihe so na ihe mere Nsibidi jiri fuo gunyere:

  • Ọfụfe Kraịst: Ndị ọcha bubatara ofufe ha ala Igbo, ndị mmadụ were rapu ofufe nna nna ha were sowe nke ahụ.
  • Ebe edere ya: A na-ede Nsibidi na ahụaja, ukwu osisi, n'akwa maọbụ akanye ya n'ahụ.

Na agbanyeghi na ọtụtụ ya efuola, akwụkwọ Ọkammuta Elizabeth Isithei dere nke ọ kporọ "History of the Igbo People" gosiri ufodụ Nsibidi ndị Igbo mgbe ochie ji ezisa ozi.

Lee Ufọdụ n'ime ha na mpụtara ha:

Alum Di na Nwunye
Nkọwa foto, Alụm Di na Nwunye
Alukwaghim
Nkọwa foto, Alukwaghim
Nsibidi
Nkọwa foto, Nwoke luru umunwaanyị abụọ na ụmụ ha
Nsibidi
Nkọwa foto, Nwaanyị chọrọ igba di ya alukwaghịm
Nsibidi
Nsibidi
Nkọwa foto, Nwunyedi abụọ na-ese okwu mgbe niile.

Ihe nkiri ga-amasị gị

Aha onyonyo, Igbuichi ndi umudioka