Nigeria vs Algeria: Algeria efoola Super Eagles nku ka a na-efo ajị imi

Obi adaala Ndị Naịjirịa mba

Ebe foto si, Reuters

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọljiria ga-ezute Sịnịgal n'agba ikpeazụ dịka Riyad Mahrez ji goolu zọpụta ndị otu ya.

Ebe Naịjirịa ga-ezute Tunishia ụbọchị 17 nke ọnwa Julaị, ebe ha ga-ama onye ga-agba onye nke atọ ma nweta ọlanchara.

Goolu Mahrez nyere si na 'free kick' ọ gbara dịka Wilfred Ndidi gbaturu Ismael Bennacer.

Mahrez

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Mahrez dọriri neetị na nkeji 90+4 tupu e gbuchie bọolụ ma mewaa ndị Naịjirịa obi.

Odion Ighalo ji penariti nye goolu ma napụta Naịjirịa n'aka ndị Ọljiria na nkeji 73, mana o zughi ịkpọba Naịjirịa n'agba ikpeazụ.

Goolu a bịara ka Aissa Mandi tinyere aka ya iji gbochie bọọlụ Oghenekaro Etebo gbara; e ji ihe nkiri Video Assistant Refree (VAR) nyochaa ya ma nye Naịjiria penariti ahụ.

Goolu a Ighalo nyere bụkwa naanị nke abụọ na-abanye n'ime poostu ndị Ọljiria kemgbe ha bịara asọmpi nke afọ a.

Ighalo

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Goolu a Ighalo nyere emeela ya goolu anọ ọ na-enye n'asọmpi a, ma mee ka ọ bụrụ onye kacha nye goolu ugbua.

Bọọlụ biri William Troost-Ekong n'ahụ ma banye na neetị na nkeji 40, iji mee ka Ọljiria jiri otu ọkpụ na-emeri Naịjiria.

Cheta na ọ bụ Troost-Ekong nyere goolu Naịjirịa ji nweta mmeri n'aka Saụt Afrịka ma banye agba ọkara-Ikpeazụ a.

goolu e nyere Naịjirịa

Ebe foto si, AFP

Ụfọdụ ndị Naịjirịa na-ewe iwe na-ekwu na ọ bụ uwe ndị Super Eagles yi mere ha ji ghara ịgbata ọfụma n'egwuregwu a.

Ha gara na Twitter na-egosi iwe ha. Lee ihe ha kwuru:

@sp_okpara kwuru na uwe a anaghị eweta ihe ọma.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

@Quadriagboola gosikwara iwe ya.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@ruudboie kpọkuru ndị na-eme uwe Naịjirịa sị ha gbanwee ya makana ọ na-ebute ọdachi.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Mana ajụjụ bụzị "ọ bụ Jersey na-agba"?

Lee ihe ndị mmadụ kwuru maka ya na Facebook anyị:

Ụfọdụ ndị ọzọ malitere ịchọ Vincent Enyeama chebuuru Naịjirịa goolu.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

@akaninh kwukwara otu ihe ahụ.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Kedụ etu obi dị gị ugbua?

Naịjirịa

Ebe foto si, AFP

Ndị Super Eagles ga-eji ihe niile ha nwere gbaa egwuregwu a, enweghi ihe ọzọ ga-ebute nke a, ọ bụrụ maka nkwa ndị ojiegoachụego kwere ha maka inye ha puku dọla iri ise maka goolu ọbụla ha ga-enye.

Skip X post, 6
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 6

Mahrez

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Amụbeghi Riyad Mahrez mgbe Ọljiria butere naanị otu Iko Mba Afrịka ha nwere; n'afọ 1990.
Ọọjerịa 2
-
1 Naịjirịa
Ozuzu oge
Nkọwa n'uju
Nhazi
Ọọjerịa
(4-1-4-1)
Naịjirịa
(4-2-3-1)
Nkọwa n'uju
  • 40
    -
    Troost-Ekong (og)
    football
    1 - 0
  • 52
    -
    Bounedjah
    1 - 0
  • 68
    -
    Feghouli
    1 - 0
  • 71
    -
    Mandi
    1 - 0
  • 72
    -
    Ighalo
    football
    1 - 1
  • 78
    -
    Chukwueze
    down
    Onyekuru
    up
    1 - 1
  • 88
    -
    Awaziem
    1 - 1
  • 95
    -
    Mahrez
    football
    2 - 1
Ọnụọgụgụ egwuregwu
Ọọjerịa
Naịjirịa
  • Oge ole eji bọọlụ
    49.8%
    50.2%
  • Shọọtụ a gbara chere ihu na neetị
    2
    4
  • Shọọtụ ole a gbara
    8
    11
  • Ịgba n'akụkụ
    1
    2
  • Egwuregwu ọjọọ
    20
    18
Ịkwụ n'ahịrị
Ndị mmalite
Ọọjerịa
  • 23
    M'bolhi
  • 4
    Benlamri
  • 21
    Bensebaini
  • 18
    Zeffane
  • 2
    Mandi
  • 17
    Guédioura
  • 22
    Bennacer
  • 8
    Belaïli
  • 10
    Feghouli
  • 7
    Mahrez
  • 9
    Bounedjah
Naịjirịa
  • 16
    Akpeyi
  • 3
    Collins
  • 22
    Omeruo
  • 5
    Troost-Ekong
  • 20
    Awaziem
  • 7
    Musa
  • 8
    Peter Etebo
  • 13
    Chukwueze
  • 18
    Iwobi
  • 4
    Wilfred Ndidi
  • 9
    Ighalo
Mgbanwe
    • 78
      Chukwueze
      down
      Onyekuru
      up
    Ndị eji agbanwe
    • 19
      Abeid
    • 1
      Doukha
    • 13
      Slimani
    • 5
      Halliche
    • 11
      Brahimi
    • 14
      Boudaoui
    • 20
      Atal
    • 6
      Fares
    • 16
      Oukidja
    • 12
      Ounas
    • 15
      Delort
    • 3
      Tahrat
    • 23
      Uzoho
    • 1
      Ezenwa
    • 17
      Kalu
    • 19
      Ogu
    • 11
      Onyekuru
    • 2
      Ola Aina
    • 21
      Osimhen
    • 6
      Balogun
    • 10
      Mikel
    • 15
      Simon
    • 12
      Shehu
    • 14
      Paul Onuachu