Obasanjo egwuzobela otu ọhụrụ a kpọrọ CNM

Ebe foto si, @CNMovement
Dịka a na-ele anya n'ihu maka ntuliaka 2019, pati dị icheiche ekpokobala mwulie pati ọhụrụ ebe onye chịburu ala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo gwuzobere otu ọhụrụ ọ kpọrọ "Coalition for Nigeria Movement".
kepukepu a na-anụ na-ekwu na a ga-edebanye otu ahụ dịka pati ndọrọndọrọ ọchịchị mana onye na-arụ n'ọba akwụkwọ Olusegun Obasanjo bụ Ayodele Aderinwale kwuru na otu ahụ abụghị otu pati mana ọ bụ otu na-etinye uchu ime ka Naịjirịa dị mma.
Ọbụghikwa naanị Obasanjo bụ onye gwuzobe otu ọhụrụ.
Ndị ọzọ bụ otu nke akpọrọ Coalition of New Nigeria nakwa otu ọzọ akaghị gwuzobe nke ọma bụ Nigerian Third Force.

Otu ndị egwuzobere ọhụrụ maka ntuliaka 2019
- Otu Coalition for Nigeria Movement (CMN) n'aha ịchafụ: Onye gwuzobere otu a bụ onye chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo, ndị ọzọ nọ na ya bụ
i. Olagunsoye Oyinlola - aka chịburu steeti Osun
- Otu Coalition For New Nigeria: Ndị kpokobara otu a bụ otu pati na-anọghị n'ọchịchị ndị ruru iri atọ n'ọnụọgụgụ
i. Alhaji Abdulsalam
- Otu Nigerian Third Force Movement: Ndị nọ n'otu a bụ
i. Donald Duke - aka chịburu steeti Cross River
ii. Charles Soludo - onye buburu onyeisi ụlọakụ ukwu CBN
iii. Olisa Agbakoba - Onye ọkaiwu a ma ama
iv. Tafawa Balewa - aka chịburu Naịjirịa
v. Ọkammụta Pat Utomi
vi. Oby Ezekwesili - Onye bubu Mịnịsta agụmakwụkwọ na onye kpokobara otu #BringBackOurGirls
vii. Frank Nweke Jr - onye buburu Mịnịsịta ọrụ mgbasa ozi wdgz...

Ndị ọnụ na-eru n'ọkwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa ekwuola na mkpokoba ndị a na-egosi na ntuliaka 2019 ga-esi ike.
N'okwu Chukwunonye Okereke, "Ntuliaka 2019 ga-adị kpọkpọnki. Ọ ga-esikwa ike mana ka a na-ele anya etu ọ ga-adị.
"Ogosila na ọ bụrụ na otu APC ebe ha jibu dịbu iri, ebe ha jizi ugbua ebelatala ihe dịka ebe anọ maọbụ ise."
Chukwunonye gwara BBC Igbo na mkpokoba otu ọhụrụ a bụ iji gwa onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na ọnaghị achị nke ọma.
Obasanjo na-ebido otu ahụ n'Abeokuta taa dịka ha na akpọku ndị Naịjirịa ka ha zonye n'otu ahụ.
Otu ahụ amalitela mgbasa ozi gbasara ha na Twita dịka ha dere na otu ahụ na-ele any ikwalite ma wulie Naịjirịa n'akụkụ niile.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post










