Obasanjo agwala onyeisiala ka o chefuo ịzọ ọchịchị 2019

Ebe foto si, PIUS UTOMI EKPEI
Buhari onwere ike ịzọ ọchịchị oneyisiala n'afọ 2019?
Onye chịbụrụ Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo degara onyeisiala Muhammadu Buhari akwụkwọ taa gwa ya ka ọ laa ezumikenka ma ọ chịcha agba nke a maka afọ ole ọ dị nakwa ahụ ike ya.
N'akwụkwọ ahụ o dere dị ibe iri na atọ, Obasanjo kwuru na onyeisiala Buhari anaghị eme nke ọma.
Obasanjo kwuru na Buhari emeghi etu a tụrụ anya n'aka ya oge o were ọchịchị, ka o jiri aka ya dụọ onwe ya ọdụ ma "ridata n'inyinya ahụ" sonyere ndị chịbụrụ ala Naịjirịa were amamihe na-etinye anya n'ọchịchị ala naịjirịa.
O kwuru na onyeisiala Buhari bụ onye ọ kwadoro n'afọ 2015 agbawala ya obi. Obasanjo kwadoro Buhari na mmegide onye na-achị oge ahụ bụ Goodluck Jonathan.
N'afọ 2013, Obasanjo dekwara ụdị akwụkwọ a nye onye na-achị oge ahụ bụ Goodluck Jonathan nke ọ kpọrọ "Tupu oge agaa" (Before Its Too Late).
Nke a degara Buhari, ọ kpọrọ ya "Ụzọ ọpụpụ: Oku Ikpọkọta ndị Naijịrịa maka ọdịn'ihu" (the Way Out: A Clarion Call for Coalition for Nigeria Movement).
Obasanjo achịbuola ala Naịjirịa ugbo abụọ n'okpuru ọchịchị otu pati PDP. O kwuru na ihe ndị merelanụ kamgbe 2015 gosiri na akwụkwọ ya degara Jonathan oge ahụ bụ ihe ziri ezie maka ihe na-eme oge ahụ.








