Ihe mere PDP ji si ka APC bụrụ ụzọ nwụchie ndị ohi nọ n'ogbe ha

Na nlọta Buhari ụbọchị Satọde nke a gara aga, okwu dapụrụ ya n'ọnụ bụ na ya ga etinye uche n'okwu ndị aka ha dị na mpụ, aghụghọ na nrụrụaka nke ọ sị na ọ bụ kachasị enye Naịjirịa nsogbu.
Buhari sị na olileanya ya bụ na ọtụtụ ndị aka ha dị na mpụ ga-aga mkpọrọ.
Ndi ntaakụkọ jụrụ Buhari ihe ndị Naịjirịa na-ele anya na nlota ya, ọ sị "Ọtụtụ ndị Naịjirịa nwere olileanya na anyị ga-atụ ndị ohi tinyere Naịjirịa na nsogbu mkpọrọ. E che m na ọ bụ ihe ha chọrọ, nke mere m ga-eji mee ya."
Mana, ndị otu pati na-anọghị n'ọchịchị bụ Peoples Democratic Party (PDP) asaala okwu a sị na Buhari kwesiri iji aka ya ndị mmadu na-asi na ọkwụ ọtọ chọwa nrụrụaka dị na pati ya bụ All Progressive Congress (APC), ọkachasị ndị otu ya eboro ebubo mpụ na aghụghọ.

Ebe foto si, AFP
N'akwụkwọ onye odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Kola Ologbondiyan binyere aka, PDP sị ka Buhari nye ohere ka-enyocha mpụ eboro onye bubụ onyeisi ndị DSS bụ Lawal Daura, nke metụtara onye bụbu odeakwụkwọ Naịjirịa bụ Babachir Lawal na nke metụtara Yusuf Usman bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ịkwụnye ụgwọ ahụike.
PDP sị na Buhari egosibeghi aka eji achụ mpụ na aghụghọ kemgbe ọ banyere ọchịchị.
Mana, onye odeakwụkwụkwọ APC bụ Yekini Nabena gwara ndị ntaakụkọ ụnyaahụ na ndị Naịjirịa nwere ohere ide akwụkwọ ka ngalaba na-ahụ maka mpụ na aghụghọ tinye anya n'ihe banyere onye ọbụla eboro ebubo.
"Ọbụghị eziokwu na Onyeisala na-achụ ndị pati na-anọghi n'ọchịchị mgbe o kwuru okwu maka ndị ga-aga mkpọrọ. Anyị niile nọ na mba ma maka onye sinetọ bu onye APC na-aza ọnu ya maka mpụ. Mgbe Onyeisiala kwuru maka ịga mkpọrọ ọbughị sọ ndị anọghị n'ọchịchị ka o bu n'uche."









