Ruga Settlement: 'Ọ gịnị ka atụmatụ a pụtara'?

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ gịnị bụdị "Ruga Settlement"? bụ ajụjụ ọtụtụ mmadụ na-ajụ dịka gọọmentị Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buharị wepụtara atụmatụ na a ga-amapụta ala a ga-e ji hibe ya bu ihe na Naịjirịa.
Dịka nchọpụta BBC Igbo siri kwuo, Ruga bụ ihe ndị Fulani na-akpọ ebe ha na-ebi.
Nke a pụtara na atumatụ a bụ ihibe ebe ndi Fulani na-achi ehi ga-ebi na steeti dị icheiche.
Atụmatụ a, n'agbanyeghị aha a kpọrọ ya, abụghị ihe ọhụrụ na Naịjirịa.
Na mbụ, gọọmentị kpọburu ya, "Grazing Reserve.
Ha mechara kpọọ ya "Cattle Colony" nke ha kwuru n'ọnwa Janụwarị afọ 2018 na steeti iri na anọ kwenyere na ya.
N'oge ahụ, onye bụ Mịnịsta na-ahụ maka ọrụugbo bụ Audu Ogbeh sị, "gọọmentị ga-eweta ego a ga-eji hibe atụmatụ a, mana ndị chọrọ isonye ga-akwụ obele ụgwọ."
Ọ gakwara n'ihu kwụọ na atụmatụ a abụghị usoro ndị Fulani na-achị ehi ga-eji napụ ndi mmadụ ala nna ha.
Gọọmentị Naịjirịa ekwubeghị usoro a ga-eji mee atụmatu "Ruga Settlement" a, mana nyocha ya gosiri na-ewepụ aha, a ga-ata ikikiri eze ịhụ ihe dị iche n'ime ya na atụmatụ "Cattle Colony'.
Etu ndị mmadụ si nabata atụmatụ a
Dịka ọtụtụ mmadụ katọrọ atụmatụ "Cattle Colony", ekweghị ekwe bụ ihe ụfọdụ ji kele atụmatụ "Ruga Settlement" a.
Ndị mmadụ mere ngagharị iwe na Benue maka ihe a
Ndị Ohaneze sị na nke ahụ abụghị ma ha
Aka na-achịgasị steeti na Ọwụwa Anyanwụ sịkwa n'aka ha adịghị ya
Dịka ndị Afenifere, bụ otu ọdịmma ndi ọdịda Anyanwụ na-amasị.
Ihe ndị Miyetti Allahnke Ọwụwa Anyanwụ kwuru
Onyeisioche Miyetti Allah nke Ọwụwa Anyanwụ bụ Siddiki Gidado kwuru na ya kwenyere n'ihe ndị gọọvanọ Ọwụwa Anyanwu kwuru maka "Ruga Settlement".
Gidado gwara BBC na ndị Ọwụwa Anyanwu enweghị ala maka atụmaatụ RUGA.
O kwuo sị kama ka ndị ọchị ehi kpọrọ ehi na agagharị ebe ana akọghị ubi ma na ebe ndị mmadu ebighi.
Ihe Gọọmentị etiti kwuru

Ebe foto si, Femi Adesina Facebook
Ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu bụ Femi Adesina gwara BBC Igbo na ọ bụ ndi gọọmentị etiti họpụtara ka ha gaa izu maka etu a ga-eji pịnyụọ ọgbaghara na-ada n'etiti ndị Fulani na-achi ehi na ndị ọkọ ugbo wepụtara atụmatụ a.
BBC Igbo jụkwara Maazị Adesina ihe mere ọfọdụ steeti, ọkachasị ndị Ọwụwa Anyanwụ ji na-akatọ atụmatụ a.
Adesina sị na ọ bụ "akpọmasị" mere ndi mmadụ ji na-akatọ atụmatụ a.
Ihe Adesina sara bụ,"O nweghị mgbe atụmatụ jiri bụrụ ihe kwesiri ịbụte esemokwu, kama ọ bụ usoro gọọmenti jiri chọọ itinyụ ọgbaghara."
Mana, onye odeakwụkwọ mgbasaozi Gọvanọ Dave Ụmahi nke Ebonyi steeti bụ Emmanuel Uzo katọrọ ihe Adesina kwuru.
Maazị Uzo sị na ihe mere ha ejighi kwenye n'atụmatụ a bụ makana e jighị ịchị ehi mara Ndigbo.
O sị; "Anyị enweghị ala anyi ga-enye ha. Ihe anyi ji ala anyị eme bụ ịkọpụta nri."
"Etu anyị nwereike iji nye aka bụ ịkọpụta akwụkwọ ehi na-ata wee resị ha."
N'okwu akpọmasị maọbụ inwe ajọ obi ebe ndị Fulani nọ, Maazị Uzo sị na nke ahụ abụghị eziokwu makana ndị Ugwu Awụsa bi n'Ọwụwa Anyanwụ n'enweghi onye na-enye ha nsogbu bụ atụrụ tawa.
"Ebe nsogbu dị bu ndị na-awakpogasi obodo, na-egbu mmadụ ma na- emebi ihe."
BBC Igbo gbara mbo ịnweta ndị na-ekwuru ndị na-achị ehi ka ha tinye ọnụ n'akụkọ a, mana o nweghị onye kwuru okwu ga-ama na ya.
Ka ọ dị ugbua, ọ dị ka gọọmentị etiti ekwechirila n'atụmatụ a, ọ bụ ka oge na-aga ka a gaa mara mpụta ya.
Ide ya ka na-ede kwa.



































