Miyetti Allah: Ihe mere ha ji bụrụ okwu akpụ n'ọnụ na soshal midia
Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:
Ihe Miyetti Allah ji ewu na soshal midia

Ebe foto si, Getty Images
Otu Miyetti Allah akpala agụ aka n'ọdụ.
Ụmụ Naijiria na-ewere ha iwe maka okwu otu onyeisi ha na Benue steeti bụ Alhaji Garus Galolo kwuru ebe ọ kpọrọ oku ka Bukola Saraki tinye akwụkwọ arụkwaghịm dịka onyeisi ụlọomeiwu ma ọ bụghị otu ahụ, ha amanye ya ka ọ hapụ ọkwa ya dịka onyeisiala.
Otu PDP site n'ọụ ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Kola Ologbondiyan katọrọ okwu ahụ ma kpọọ Onyeisiala Buhari oku ka ọ nwuchie ndị ndu otu Miyetti Allah, ma ha ikpe maka 'atụmatụ
Igbo Ekulie kpọrọ oku ka gọọmenti hapụ ụmụnwaanyi a

Ebe foto si, Getty Images
Ọgbakọ ụmụafọ Igbo maara nke ekwe na akụ na ọrụ bụ Igbo Ekunie Initiative agbarụọla ihu kpọọ oku ka ndị uweojii tọhapụ ụmụnwaanyị Igbo ruru otu narị ha ji eji.
Ndị uweojii kpọchiri ụmụnwaanyị a maka na ha mere ngagharịiwe ka gọmentị etiti tọhapụ
Nnamdị Kanu bụ onye ndụ Ipob ejieji kemgbe afọ gara aga.
Ekweremadu akpọọla oku ọzọ maka ọchịchị onyeisiala

Ebe foto si, Getty Images
Osote onyeisi ụlọomeiwu Sineti bú Ike Ekweremadụ akpọọla oku ọzọ ka ọnọdụ onyeisiala na nke ndị gọvanọ bụrụ otu ugboro afọ isi.
Ekweremadụ, bụ onye na arụ ndị ọrụ gọọmenti etiti aka maka ọgbaghara dị ,tụrụ ariri maka tigbuo zogbuo di na ndorondoro ọchịchị ugbua ebe ejighizi ezi ọchịchị kpọrọ ihe maka ntụlịaka 2019 na abịanu.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi, Mba Amerịka amanyela ego ruru ijeri dola iri na isii na ngwahịa si China.
Ngwahịa ndị a gunyere kemical, plastik nakwa ọgbatumtum. China ekwuola na-ga ga-emekgwara.
N'egwuregwu,
David Beckham wụsara akpụkpọ ụkwụ o ji agba bọọlụ n'afọ 2013, ga-enweta nturuugo n'aka otu UEFA.

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, obi adịghị ndị na-agba bọólụ na Spain mma ebe ndị mkpokota ha bụ La Liga kwetere iburu asọmpi ha buga na mba Ameriika.
Sergio Ramos na Sergio Busquets bụ ndị nọ na isi okwu a sị na aka ndị ọgbaa bọọlụ esoghị na ya bụ nkwekọrịta ma kwukwe na ha nwere ike ịgba abụbụ ọrụ maka ya.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:
Na agbanyeghị nsogbu dị n'etịtị ndị obodo ọzọ dị na Naịjirịa na ndị Fulani na-achi ehi, Akwuke n'Enugwu steeti na ndị na-achị ehi na-ebi n'udo.












