"Anyị nwụchiri ụmụnwaanyị Ipob otu narị maka ngagharịiwe" - Kọmishọna uweojii Imo steeti

Aha nkeananụānụ, "Anyị nwụchiri ụmụnwaanyị Ipob otu narị" - Kọmishọna uweojii Imo steeti

Ndị uweojii n'Imo steeti nwuchiri ụmụnwaanyị otu Ipob ruru otu narị maka ime ngagharịiwe n'Owere ụnyaahụ bụ Fraịde.

N'okwu ya, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Andrew Enwerem kwetara na ndị uweojii ji ụmụnwaanyị Ipob ruru otu narị maka " Ime ngagharịiwe na-anataghị ikike n'aka ha, ya na maka ịbụ ndị otu iwu mabidoro."