A napụla dokịta akwụkwọ ikike ya maka ịtụnye nwaanyi 11 ime

Dkta Norman Barwin

Ebe foto si, CBC

Nkọwa foto, A napụla Dkta Norman Barwin akwụkwọ ikike dịka dokịta maka ebubo iji ọbaraọcha ya(sperm) tụnye opeka mpe mmadụ iri na otu ndị o nyere nleta maka ịmụta nwa

otu na-ahụ ọrụ ahụike na mba Canada anapaụla otu dọkịta na-ahụ maka nleta ndị nwere nsogbu amụtaghị nwa akwụkwọ ikike ọrụ maka iji mmiri ahụ ya tụnye ndị ọ letara ime.

Otu a kpọrọ 'College of Physicians and Surgeons' nke Ontario dị na Kanada kpọrọ ihe Dọkịta Norman Barwin mere arụ kwọ nwa.

Ha tụrụ arịrị na ọ bụ naanị ịnapụ ya ikike, bara ya mba n'ọha nakwa daa ya nha bụ ihe ha nwere ike ime iji taa ya ahụhụ maka ihe o mere.

Onyeisi kọmiti na-ahụ maka ntaramahụhụ nye onye dara iwu nke otu ahụ bụ Dr Steven Bodley sịrị Badwin," Ị rapụtara ndị ịna-eleta wee si na agwa ọjọọ gị mebiere ezịnaụlọ ha ihe agaghị emekwadato ọtụtụ agbọ rụọ na agbọ."

Carolyn Silver

Ebe foto si, BBC News

Nkọwa foto, Ọkaiwu otu ndị dibia bekee "College of Physicians and Surgeons" nke Ontario bụ Carolyn Silver ka ọ na agwa ndị ntakụkọ ozi

Otu ahụ bidoro inyocha Barwin ka a gbachara ya akwụkwọ n'ebubo na ụmụaka ruru agbata iri ise na otu narị bụ ndị a mụrụ ka nne ha natachara ọbaraọcha ya(sperm) na ekwesịghị n'aka ya.

N'ọnwa Nọvemba, 2016, a gbara dọkịta Norman Barwin akwụkwọ ka nyocha DNA e mere gosipụtara na ọ bụ ya bụ nna nwa onye bụbụ onye ọrịa n'ụlọọgwụ ya.

Akụkọ maka ebubo a pụtara ihe n'ọnwa Novemba afọ gara aga ka Daniel na nwunye ya bụ Davina Dixon na nwa ha nwaanyị bụ Rebecca gbara Dọkịta Barwin, Nelligan, O'Brien na Payne akwụkwọ n'ụlọikpe dị n'Ontario.

Ezinaụlọ nwere mkpebi iwepu okwu ahụ ụlọikpe ka ha chọpụtachara na Rebecca abụghị Maazị Dixon mụrụ ya.

Ezịnaụlọ Dixon gakwuru Dọkịta Barwin n'afọ 1989 ka o nyere ha aka ịtụ ime, e mecha mụọ Rebecca n'afọ na-eso ya.

Dịka akwụkwọ ebubo ha siri kwuo: "Davina anọkwataghị n'ihi na ya na Daniel nwere anya na-acha ka ihu igwe, ebe Rebecca nwere anya na-acha aja,aja.

Ha a mechara chọta onye ha chere na ọ bụ nwanne Rebeccam onye nne ya bụkwa otu nwaanyị garala nleta maka itụ ime n'aka Dkta Barwin.

Rebecca, Davina na Daniel Dixon

Ebe foto si, Rebecca Dixon

Nkọwa foto, Ezinaụlọ Dixon chọpụtara n'afọ na Daniel abụghị nna mụrụ Rebecca.

Opekampe, mmadụ 11 na-ebo ebubo na ọ bụ ya bụ nna mụrụ ha, dịka ndị ọkaiwu ha siri kwuo.

Ndị a na mmadụ iri ise (50) ndị ọzọ ndị nwetara nleta n'aka dọkịta ahụ ndị nyocha DNA ha eyighi nke onye ha kpọrọ nna mụrụ ha, gbara ya akwụkwọ n'ụlọ ikpe.

Ebubo gbadoro ụkwụ n'ihe mere kemgbe afọ 1970 ma metụta ụlọọgwụ abụọ na-ahụ maka inyere ndị ime na-esiri ike aka dị n'Ottawa, Ontario bụ Broadview Fertility Clinic na Ottawa General Hospital.

Mana ọkaiwu Dkta Barwin bụ Karen Hamway dekweghị saa ebubo ndị a e boro nsonso a.

Ndị ọkaiwu Peter Cronyn na Frances Shapiro Munn kwuru na ha hụrụ mmadụ iri na otu ndị nne na nna ga gara hụ Dkta Barwin maka inweta nleta gbara ime isi ike ndị bụ nwa ya dịka nyocha DNA ha mere siri gosipụta.

Ụfọdụ bụ ndị e kwesịrị inweta nkwado ọbaraọcha (sperm) onye ha amaghị, ebe ụfọdụ bụ ndị kwesịrị inweta ọbaraọcha nke di ha.

Ha hụkwara mmadụ iri na isii ndị e kwesiri iji ọbaraọcha nna ha mụọ mana nyocha DNA e mere eyighi nke nna ha.

Dịka Cronyn na Shapiro Munn siri kwuo, n'ọnọdụ ndị a, amaghị ndị bụ nna mụrụ ha na'ezie.

Ha gara n'ihu kwuo na e nwere mmadụ iri atọ na ise ndị e kwesiri ka e jiri ọbaraọcha ndị akpọghị aha ha ndị nwere ike ha agahị abụ ndị e chere na ha bụ.

E nyebuọla Dkta Barwin ntaramaahụhụ n'afọ 2013 maka intinyere mmadụ atọ ọbaraọcha ekwesighị n'ụlọọgwụ ya dị n'Ottawa.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ