Ị hụla di na nwunye na-amụtaghị nwa n'ihi 'amaghị eme'?

Di na nwunye ndị mba China na-achọ nwa gara ịhụ dibịa bekee maka ọnọdụ amụtaghị nwa nke merela afọ anọ nna agbanyeghị na ha na-emekọ kwa oge.
Mana nchọpụta ọkammụta n'ihe gbasara ịmụ nwa, a kpọrọ Liu Hongmei mere gosdsiri na dị na nwunye ahụ amaghị eme mmekọrịta nwoke na nwaanyị.
Dike akwụkwọ akụkọ Newsweek siri dee, dibia bekee ahụ sị, " Di na nwunye ka nọ na ntorobịa; nwoke dị afọ 26, nwaanyị dị 24. Ha nwere ahụike mana na agbanyeghị na ha alụrụ afọ anọ, ha amụtaghị nwa."
Mpụtara nyocha ahụ abụghị ihe a tụrụ anya. Liu chọpụtara na mmadụ abụọ sị otele nsị emekọ, hapụ ahụ nwaanyị.
Nwaany i ahụ kwetara n'ahụ na-afụ ya fụ ma ya na di ya nọkọọ.
Liu, dịka ụlọakụkọ ahụ siri kọwa, nyere ha akwụkwọ na-akụsị etu esi emekọ, nwaanyị ahụ tụrụ ime ka ọnwa anọ gachara."Afọ anọ ka di na nwunye lụrụ, nwoke amaghị eme nke nwanyị na-ama enwe mmekọ.
Na China anaghị emepe ọnụ ekwu okwu gbasara mmekọrịta nwoke na nwaanyị.





