RUGA Settlement: Ụmụ Naịjirịa agbarụọla ihu ọzọ maka atụmatụ a

Ebe foto si, PHILIPPE DESMAZES/AFP/GETTY IMAGES
Ọtụtụ mmadụ gosipụtara iwe n'elu soshal midia na-akpọ oku ka gọọmentị etiti machie atụmatụ RUGA settlement ha na-akwado ịmalite.
Ha ji nke Bekee kpọr hashtag #SaynotoRUGA were depụta ihe dị ha n'obi gbasara ya.
Lee ihe ndị ha kwuru ebe a
Aremu kwuru na atụmatụ a adịghị ka ihe gọọmentị etiti chere ọfụma tupu ha ewepụta.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Damixo kwuru na ịchị ehi bụ ọrụ mmadụ na-arụrụ onwe n'agbasaghị gọọmentị chaa chaa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ebe Khalid na-ekwua ka ndị mmadụ gba mbọ ghọta RUGA tupu ha egosi iwe ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ọzọ,

End of X post, 4
Ndị mmadụ pụtara ịkwado COZA na ngagharị iwe emere megide ha taa n'Abuja nakwa Legọs.
Ụfọdụ ndị echere na ha bụ ndị COZA pụtara ịkwado ụkọchukwu ha bụ Biodun Fatoyinbo taa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Ebe ndị mmadụ boro ụlọụka ahụ ebubo na ha gobiri ndị agboro bịa nọchite anya ha.

Ebe foto si, Twitter/CAF
Ndị otu egwu Super Eagles nke Naijiria ga-ezute mba Madagaska na asọmpi iko mba Afrịka a kpọrọ 'Africa Cup of Nations' taa.
Asọmpi nke taa ka a ga eji mara ndị ga-abụ ndị nke mbụ n'otu 'Group B'.
Naijiria meriri mba Burundi nakwa Guinea na asọmpị abụọ gara aga iji nweta akara isii.
N'aka nke ọzọ Madagascar meriri Burundi, ebe ha na Guinea gbara nhatanha (2-2) nke mere ka ha nweta akara anọ.
Ahmed Musa bụ osote onye ndu Super Eagles kwuru na ha ga-anwa ike ha iji bulata iko AFCON nke afọ a na-agbanyeghi na a ka ji ha ụgwọ nke ha gbarala agba.
Gịnị na-akpata ebighi n'udo?

Ebe foto si, Twitter/@MBuhari
Onyeisiala Muhammadu Buhari ebidola nrụrịtaụka iji wee kpokọba kọmiti ga-ahụ maka inyocha ihe na-ebute nwakpo dị n'etiti agbụrụ na agbụrụ ma kwụsị ya bụ ọdachị.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ onyeisiala bụ Garba Shehu kọwara na otu a ga-agụnye ndị ọrụ nchekwa, ndị okpukperechi, ndị ọrụ ugbo, ndị na-achụ nta ,ndị ụlọọrụ okpuruọchịchị nakwa ndị eze ọdịnaala..
Iweta nchekwa na-emefughi ego

Ebe foto si, PIUS UTOMI EKPEI
Aka chiburu Steeti Imo bụ Rochas Okorocha ekwuola na ohi na ntọ ga-ebelata na Naijiria ma ọbụrụ na gọọmenti were ọrụ nchekwa nyefee ndị eze ọdịnala n'aka.
O kwuru na ọbụ etu a ka o si wulie nchekwa na Imo na-emefughi nnukwu ego ọbụla oge ọ bụ gọvanọ steeti ahụ.
Na mba ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ezutela ogbo ya nke mba Nọt Koria bu Kim Jong Un.
Ndị isiala abụọ ahụ zutere n'oke ala jikọrọ mba Saut Koria na Nọt Koria nwa mgbe nta n'ụtụtụ taa bụ abalị iri atọ nke ọnwa Juun 2019.
Trump bụ onye nọ njem nleta na Saut Koria kwuburu na ọ ga amasị ya ma ya na Kim Jong Un kelee onwe ha iji gosi na onweghi esemokwu di n'etiti ha abụọ.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu egwu bọọlụ nke mba Ghana na ndi Cameroon gbara onwe ha onye lawa onye lawa na asọmpi AFCON nke ha gbara ụnyaahụ.
Nke a pụtara na Cameroon ka bụkwa ndị nke mbụ na otu 'Group F' n'ihi na ha nwere akara anọ ebe Ghana nwere nanị akara abụọ.
Ghana ga-ezute Guinea Bissau ebe Cameroon ga-ezute Benin Republic ụbọchị Tuuzdee iji mara ndị ga-agafe n'agba nke abụọ.

Ebe foto si, Twitter/@FIFAWWC
N'iko mba ụwa ụmụnwanyị, mba Sweden mere ihe tụrụ mmadụ n'anya mgbe ha ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu wee dulaa mba Jamani ụnyaahu.
Sweden na Netherlands ga-achịpụ ya ebe mba Ingland na Amerịka ga-ezute na agba nke 'Semi final' ụbọchị Tuuzdee na Wenezdee.
Akụkọ ga-amasị gị: