Nigeria Vs Guinea: Ugo amaburula enyi Guinea tụọ n'ala

Ebe foto si, Getty Images
Dịka Naijiria na Guinea na-ezute onwe ha ugbua, ọ bụrụ na Naijirịa merie, ha etozuo ịbanye agba nke 16 n'asompị Afcon.
Asọmpi a bụ ọgụ na mgba dị n'etiti dike abụọ, enweghi onye nyere ibe ya goolu n'ime ọkara mbụ ha gbara.
Mana Naịjirịa ji bọọlụ n'ụkwụ karịa ndị Guinea dịka otu abụọ gbara shọọtụ anọ nakwa atọ chere la ihu na neetị.
N'ime nkeji iri 27, 62 na 66 Simon Falette, Ahmed Musa na Ernest Seka nwetere akwụkwọ odo odo nke eji dọọ ha aka na ntị.
N'ime nkeji 73, Kenneth Omeruo ji isi sụba gọọlu n'opio ndị Guinea site na bọọlụ elu Moses Simon gbaara ya.






