Mikel Obi: Kedụ ihe m bịara ime ma ọbụghị ibu Iko AFCON

Ebe foto si, Getty Images
Mikel Obi ga-edu ndị otu Super Eagles nke Naịjirịa gaa mba Ijipt maka asọmpi Iko mba Afịrịka akpọrọ AFCON 2019 ekwuola na ọ bịaghi igwu egwu n'ihi na imeri ma buru kwa iko AFCON na-agusi ya ike.
O ruola afọ isii Mikel Obi metụrụ Iko Mba Afịrịka aka. Mgbe ahu bụ mgbe Naịjirịa meriri na mba Saụt Afịrịka.
Mgbe ọzọ Mikel gbata ihe n'Afịrịka bụ n'afọ 2006 na 2010 bụ mgbe otu Super Eagles gbatara ndị nke atọ.
N'oge AFCON a, Mikel ga-edu ndị ụmụ okorobia ọbara ha dị ọkụ were sọọ asụmụpị nke afọ a na Ijipt.
Mikel kwuru: "N'agbanyeghi na ndị otu Eagles nke ugbua abụghị ndị aka ochie n'izute mba Afịrịka ndị ọzọ ka ya, asụmpị a ga-enye ndị dị ka Samuel (chukwueze) na Paul (Onuachu) ohere igosiputa nka ha. Enwekwara m olileanya na anyị ga aga ijiptu ma tụrụ ugo lọta."

Ebe foto si, Getty Images
O kwukwara n'obi dị ya ụtọ etu ndị Super Eagles siri agba mbọ n'agbanyeghi ọnyụpa ha dara n'asụmpị Iko Mba Uwa.
Mikel kwetere na asụmpị a ga-esi ike mana o kwenyere na nka na nkwado ụmụ Super Eagles ga enyere ha aka imeri asụmpi a.
Chetakwa na Mikel Obi gbaara Naịjịria bọọlụ nke mbụ n'afọ 2005 mgbe Super Eagles na otu egwuregwu mba Libya zutere.
Mikel kwuru n'asọmpị a nwere ike ị bụ nke ikpeazu ya n'uwe Super Eagles.
Ọ sị; "otu ọbula ọ dị aga m agbalị ka ọ di nma."









