CAF 2019: Naịjirịa ejirila Burundi taa atụ ụtụtụ

Ebe foto si, Getty Images
Otu Super Eagles nke Naịjiria azarala aha nna ha dịka ha ji mmeri mepe asọmpi iko mba Afrịka nke 2019.
Ọ bụ na nkeji 77 ka Ighalo jiri otu ọkpụ dọka neeti ndị Burundi.
Mba Burundi nwara ike ha ị sata goolu ahụ mana ọ mịtaghị mkpụrụ na ngwụcha asọmpi ahụ.
N'ime ihe a niile otu onye aha ya na-ewu ewu bụ Samuel Chukwueze dịka ọ gosiri onwe ya n'asọmpị a.
Cheta na Samuel Kalu esoghi ibe ya gbaa bọọlụ taa dịka o koropuru ụnya ahụ mgbe ha na-eme nkuzi.
Lekwa ozi Kanu Nwankwo ziri ndị Super Eagles tupu ha ezute mba Burundi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post





