Drug Abuse: A tụgharịrị okwu banyere ndị uweojii ise igbo - Adinuba

Willie Obiano

Ebe foto si, Anambra Igala Youth Council

Nkọwa foto, Willie Obiano nọ agba nke abụọ ya dịka gọvanọ Anambara steeti

Don Adinuba bụ Kọmisọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Anambara steeti awụọla miri oyi n'akụkọ ụfọdụ ndị ntaakụkọ dere banyere ndị uweojii na Gọvanọ Obiano.

Ụnyaahụ ndị ntaakụkọ dere na gọvanọ Obiano sị ka ndị uweojii kwụsị ịnụ ọgwụ ike ọkachasị nke akpọrọ igbo maọbụ indian hemp.

Akụkọ sịbụ na ọ bụ Dọkịnta Simeon Onyemaechi - bụonye nọchịtere anya Ọbịanọ n'ọgbakọ nkuzi nke ngalaba gọọmenti na-ahụ maka ịkpachi ọgwụ ike bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) hiwere n'Ọka, isiobodo Anambra steeti - kwuru ihe okwu.

Akụkọ sị na Dọkịnta Onyemaechi sị na "ọ ka mma ịgbasọ ọrụ nchekwa site atụmatụ nke ọgbara ọhụrụ, karịa ịji akpụobi sitere n'anya igbo arụ ọrụ ha."

Dọkinta Onyemaechi bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka nchedo ahụike nke Bekee kpọrọ Health Insurance Scheme.

Maazị Adinuba sị na ọ bụ eziokwu na Dọkịnta Onyemaechi gara nnọchite anya Obiano n'ọgbakọ a, ma kwukwa okwu banyere ọgwụ ike "dịka ọ bụ ihe eji mee ya bụ ọgbakọ" okwu ya abụghị ịkọ ndị uweojii ọnụ maọbụ bo ha ebubo.

Ọ sị; "Ọ bụ ka onyeisi ndị NDLEA n'Anambara bụ Sule Momoh kwuchara okwu we si ka ndị nchekwa nye aka lụsị ọgwụ ike ọgụ site n'ime ndị eji ama atụ ka Dọkịnta Onyemaechị tinyere ọnụ wee kwado okwu a.

"Nke a were buru makana ndị sị na ha na-anụ ọgwụ ike iji nye ha mụọ ịrụ ọrụ."

Maazị Adinuba gara n'ihu kọwa na onweghị oge okwu jiri bụru ohere iji katọ ndi uweojii dịka ụfọdụ mmadụ na-ekwu.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed na nzaghachị kwuru na anya doro ndị uweojii n'ọrụ ha, na ha anaghị akpa agwa ekwesịghị ekwesi.

Mohammed sị; "Ndị ọrụ anyị bụ ndị na akpa agwa kwesịrị ekwesị. O nweghị ihe aka ebe gọsịị na ha na-akpa agwa dị aṅa."

Akụkọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Don Adinuba maka ndị ọchịehi Fulani.