Obiano: Kwakọrọnụ si n'Onicha na Ọka pụọ

Obiano

Ebe foto si, GovernorObianoFacebook

Nkọwa foto, Gọvanọ Willie Obiano nọ n'agba nke abụọ ya dịka onye mbụ na'Anambra Steeti

Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano emechiela ndị ọgbatumtum ịgba n'Onitsha na Awka site n'abalị mbụ nke ọnwa Julịa.

Onye tinyere aka n'ozi a bụ onye odeakwụkwọ ya na mgbasa ozi bụ james Eze n'ụbọchị taa bụ nke si ma mkpebi ndị isi ọchịchị steeti ahụ.

Gọọmentị kwuru na"Mmachi ndị ọgbatụmtụm a bụ iji belata mpụ na ohi dị n'Onicha (Onitsha) bụ obodo isi azụmaahịa nakwa Oka(Awka) bụ isi obodo steeti".

Ndị isi ọchịchị gaara n'ihu nye ndị bi na gburugburu akwa mmiri Niger abalị mbụ nke ọnwa Ọgọsụtụ ka ha kwakọrọ pụọ n'otu aka ahụ.

Ọgbatumtum

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọgbatumtum bụ ụzọ ọzọ ndị mmadụ iji eme njem

Ha kwuru na a ga-akutusi ụlọ ndị dị na gburugburu akwa ahụ, iji nyocha ihe ndị omekaome na-eme aba ahụ.

Gọọmentị kwuru na oge enyere ndị a bụ ka ha nweike nghazie onwe ha tupu gọọmentị amalite ọrụ ịzaacha na ikpocha Anambra Steeti.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ