Ọkaiwu: Iwu akwadoghi ikpe mmadụ ikpe n'azụ

Olisa Metuh

Ebe foto si, Channelstv

Nkọwa foto, Metuh na-agọ na aka ya adịghị na mpụ na aghụghọ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ọtụtụ ndị mmadụ akatọọla mkpebi Ọkaikpe Okon Abang n'ịga n'ihu ikpe odeakwụkwọ otu PDP bụ Olisa Metuh ikpe n'azụ.

Cheta na Olisa Metuh dara n'ụlọikpe dịka ọ na-azara ọnụ ya maka ebubo mpụ ego dị nde narị naịra anọ n'ọma, nke a mere i ji buru ya gawa ụlọọgwụ.

Mana onye ọkaikpe Okon Abang ji ikpe kwuru na ịkpe a ga-aga n'ihu ma Metuh ọ nọ ya ma ọ nọghị ya.

Ọtụtụ ndị mmadụ na naịjirịa katọrọ Okon Abang maka mkpebi a site n'akara twitter ha dị icheiche.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Ebe ndị ọzọ kwuru na onweghi ọrịa na-arịa Olisa Metuh na ọ kpachara anya daa n'ụlọ ikpe.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Mgbe BBC igbo gbara onye ọkaiwu bụ Chijioke Agbo ajụjụọnụ n'ekwentị maka nke a, o kwuru na Naịjirịa kwadoro ka e nye mmadụ ohere ịzara ọnụ ya n'ụlọikpe.

O kwuru na ọ bụrụ na ahụ adịghị onye ahụ ike, na a ga-enye ya ohere ịgbake n'ute ọrịa tupu ikpe ahụ a gaa n'ihu.

Agbo kwuru na mkpebi ọkaikpe Okon Abang ezighi ezi dịka akwụkwọ iwu Naịjirịa jiri kwuo.

Gere okwu ya ebe a;

Aha onyonyo, Ọnye ọbụla nwere ohere ịzara ọnụ ya n'ụlọikpe.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: