Ọkaiwu: Iwu akwadoghi ikpe mmadụ ikpe n'azụ

Ebe foto si, Channelstv
Ọtụtụ ndị mmadụ akatọọla mkpebi Ọkaikpe Okon Abang n'ịga n'ihu ikpe odeakwụkwọ otu PDP bụ Olisa Metuh ikpe n'azụ.
Cheta na Olisa Metuh dara n'ụlọikpe dịka ọ na-azara ọnụ ya maka ebubo mpụ ego dị nde narị naịra anọ n'ọma, nke a mere i ji buru ya gawa ụlọọgwụ.
Mana onye ọkaikpe Okon Abang ji ikpe kwuru na ịkpe a ga-aga n'ihu ma Metuh ọ nọ ya ma ọ nọghị ya.
Ọtụtụ ndị mmadụ na naịjirịa katọrọ Okon Abang maka mkpebi a site n'akara twitter ha dị icheiche.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Ebe ndị ọzọ kwuru na onweghi ọrịa na-arịa Olisa Metuh na ọ kpachara anya daa n'ụlọ ikpe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Mgbe BBC igbo gbara onye ọkaiwu bụ Chijioke Agbo ajụjụọnụ n'ekwentị maka nke a, o kwuru na Naịjirịa kwadoro ka e nye mmadụ ohere ịzara ọnụ ya n'ụlọikpe.
O kwuru na ọ bụrụ na ahụ adịghị onye ahụ ike, na a ga-enye ya ohere ịgbake n'ute ọrịa tupu ikpe ahụ a gaa n'ihu.
Agbo kwuru na mkpebi ọkaikpe Okon Abang ezighi ezi dịka akwụkwọ iwu Naịjirịa jiri kwuo.
Gere okwu ya ebe a;