Ipob emezuola ebunobi ikposaa ọgbakọ Ohaneze-Emma Powerful

Ebe foto si, Getty Images
Otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra bụ Ipob ekwuola na ha mezuru ebunobi ha ikposa ọgbakọ Ohaneze mere n'Awka ụnyaahụ.
BBC gbara onye mgbasaozi Ipob bụ Emma Powerful ajụjụ, o kwuru na ihe gaziri ka ha si chọọ.
Powerful kwuru na otu n'ihe gozsiri na ọgbakọ ahụ kpụrụ afọn'ala kwuru na ọtụtụ ndị gọvanọ na sinetọ sị mpaghara ọwuwa-anyanwu abịaghị ya.
N'okwu ya, "Nnia Nwodo ekwughị okwu, ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ niile abiaghị ya ma ewepụ naanị Govanọ Obiano nke Anambra steeti bụ onye a bịara na nke ya."
Ma na agbanyeghị ngagharịiwe ndị Ipob mere ebe ahụ, Ohaneze Ndigbo gara n'ihu mee ọgbakọ ha hiwere ịkpa maka nhazigharị Naịjirịa .
Ihe ha kpebiri n'ọgbakọ ahụ gunyere; Ka e kepụtakwuo otu steeti na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa nakwa ikpochapụ atụmatụ okpuru ọchịchị.

Akụkọ ga-amasị gị:







