Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ma Olisa Metuh anọ ya ma ọnọghị, ikpe ya ga-aga n'ihu
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a:
Olisah Metuh anọ ya ma ọ nọghị ya, ikpe ya ga-aga n'ihu.

Ebe foto si, Channelstv
Nke a bụ maka na Ụlọikpe etiti n'Abuja enyela ndị EFCC ikike ịnwale ya n'azụ ya.
Metuh bụbu onye nkwuchiteọnụ ndị PDP na-aza ọnụ ya n'ebubo gururu asaa maka ego nde narị naịra anọ ọ natara ụlọọrụ onye ndụmọdụ nchekwa obodo n'oge ọchịchị Goodluck Jonathan.
Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ndị na-arụrụ obodo ọrụ a na-akpọ 'Civil Service' na Bekee bụ Winifred Oyo-Ita kwuru ka e nyochagharịa ego ụgwọ ọnwa ndị ọrụ.
O kwuru na nke a ga-eme ka ndị ọrụ na-etinye uchu n'ọrụ ha.
Akụkọ mba ofesi

Ebe foto si, AFP
Mmadụ abụọ ọzọ anwụọla maka Ebola na kongo.
Ụmụnne ndị ahụ nwụrụ gara kpọpụta ha ebe e kewapụrụ ha kpọrọ ha gaa n'ụlọụka ka e kpere ha ekpere.
Nwaanyị mere nwa ya n'ike ịlụ di agala nga

Ebe foto si, PA
A tụrụ otu nwaanyị na mba UK nga afọ anọ n'ọma taa.
Maka na o manyere nwa ya nwaanyị n'ike lụọ nwanne ha nwoke ji ọtụtụ afọ tọpịa ya.
N'egwuregwu,
Kemgbe afọ 22, onye ọhụrụ na-akụzizi otu egwu bọọlụ Arsenal

Onye nkuzi ọhụrụ otu egwu bọọlụ Arsenal bụ Unai Omery ewerela oche ma mee ọgbakọ mbụ nke ya na ndị ntaakụkọ taa.
O kwuru na ya agaghị ekwe nkwa na ha ga-emeri mana ha ga-ejikọ aka ọnụ rụọ ọrụ.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:











