Igbo culture: Uru iri na abụọ ọmụ baara ndị Igbo

Igbo sị na a tụọrọ ọmarụ, ọmaru ma a tụọrọ ofeke, o tinye isi n'ọhia.
Igbo bụ ndị Chukwu ji amamihe were gozie.
Omenala Igbo dị omimi ma bụrụkwa ihe Igbo ji anya isi.
Otu n'ime ihe e jiri mara ndị Igbo bu "ỌMỤ".
Dịka ndị ihe Igbo na-amasị, BBC Igbo kpọrọ onye ọkachamara n'ihe gbasara omenala Igbo ma bụrụkwa onyeisi ndị otu Ekpe nke Ogbodiukwu dị n'Ụmụọkpara, Abịa steeti, bụ Ọkaiwu Nzenwa Ibe.
Ọ gwara anyị ihe ndị bụ "njirimara" ọmụ nakwa ihe ndị Igbo ji ọmụ eme.
Ihe e ji ọmụ eme
- Ebe ọbụla e kere ọmụ maọbụ tinye n'ala na-egosi na a na-azọ ala ahụ azọ.
- E ji ọmụ ekechi ihe dị iche iche dịka ụgba, ogiri, nakwa akwụkwọ nri.
- Ihe e ji ọmụ kechie n'ala Igbo, anaghị ezu ya ezu; dịka onye kpara nkụ n'ọhịa ga-etinye ọmụ na nkụ ya iji gosi na ọ bụ mmadụ nwe ya.
- E jikwa ọmụ egosi ihu arụsị ma na-asị kwa ndị mmadụ abatala ebe ahụ.
- E jikwa ọmụ egosi ebe mmanwụ na-esi apụta.

6. Ọmụ e kere n'ukwu osisi na-egosiputa na osisi ahụ dị nsọ n'omenala Igbo.
7. E kee ọmụ n'ụgbọala, ọ na-egosị na ụgbọala ahụ bu ozu.
8. Onye mmadụ bịara nye ọmụ n'aka, dịka ịsị onye ahụ na ya "kpachara anya" n'ebe onye ahụ nọ; ya bụ ịdọ aka na ntị.
9. Ndị otu Ọkọnkọ na-eji ọmụ ekewapụta onwe ha na ndị ọzọ na-abụghị ndị otu ha.

10. N'ebe dị ka Ibeku, Ụmụahịa, n'ala Igbo, igbubi ọmụ na-egosi na e mechaala mmemme ahụ dịka ekpe.
11. N'Ọhafịa, ndị na-agba egwu ikpirikpi ọgụ na-akpụrụ ọmụ n'ọnụ.
Ha agaghị ewepụ ya tupu agbachaa egwu a.
12. N'agba ọhụrụ a, ndị ụka ji ọmụ eme ụkaọmụ bụ 'Palm Sunday' na Bekee.
Ọ bụ ụbọchị ncheta etu Kraist siri banye Jerusalem dịka onye eze.














