Herdsmen radio: Ọ bụghị maka naanị ndị ọchị ehi - NBC

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbasa ozi bụ National Broadcasting Commission sị na Fulani redio bụ maka iji kuzirie ndị ọchị ehi, ndị ọrụ ugbo na ndị na-akụ azụ ihe.
Ụlọọrụ a gara n'ihu gwa ndị ụlọọrụ ntaakụkọ ka ha kpachara anya etu ha sị akọ akụkọ ihe ọbụla nwereike ikewa ịdị n'otu nakwa udo dị na Naịjira.
NBC kwuru nke a na nzaghachị ebubo eboro na gọọmentị nyere ndị ọchị ehi ohere inwe ụlọọrụ mgbasa ozi redio.
Site n'ozi ha wepụtara, NBC kwuru na ụlọọrụ 'National Commission for Nomadic Education' tinyere akwụkwọ maka inweta ikike mgbasa ozi.

Ebe foto si, Getty Images
NBC nyere ha akwụkọ ikike a n'ụbọchị 28 Seputemba afọ 2018 bụ nke malitere ọrụ site n'ụbọchị 8 Ọktoba afọ 2018 rue 8 Ọktoba afọ 2023.
Ha kwukwara na mgbasa ozi ha bụ maka 'ezi mmụta' nke ehiwere maka ndị ọchị ehi, ndị ọrụ ugbo, ndị dinta nakwa ndị na-akụ azụ.
Cheta na ọtụtụ otu gụnyere Ipob, Ohanaeze Ndigbo, Afenifere na Middle Belt Forum akatọọla gọọmentị maka inye ohere ihiwe Fulani redio.





