Aisha Buhari: Ọrụ mwulite ndụ ndị mmadụ nke gọọmentị a kpụrụ afọ n'ala

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ dị mkpa

Aisha Buhari

Ebe foto si, Aisha Buhari Facebook

Nkọwa foto, Nwunye Buhari na-ekwukarị uche ya n'ihe gbasara gọọmentị di ya

Nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari akatọọla ego dị ijeri narị naịra ise amapụtara maka nwulite ndụ ndị mmadụ ma kwuo na atụmatụ a mara afọ n'ala.

Aisha, onye gosiri iwe ya mgbe ọ na-agwa ụmụnwaanyị okwu n'Abuja n'ụbọchị Tọzde kwuru na onweghi ihe ọbụla ahụrụ anya eji ego ahụ mepụta karịsịa ọkarịchara mpaghara ugwu nke a Nịajirịa.

Aisha rụtụrụ aka na steeti ndị dịka Adamawa na Kano achịtaghị aja ọbụla n'ime atụmatụ a a kpọrọ 'Social Investment Programme'

A sị na ọ bụ okwu na-ebute okwu. Okwu Aisha a mụnyere ọkụ na soshal midia dịka ọtụtụ mmadụ tinyere ọnụ n'okwu a.

Abiodun Bello sị ka Aisha kwụsị ịkatọ ọchịchị dị ya:

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ebe Apha femal ji Aisha na tụnyere Patience Jonathan:

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ipob kpachara anya unu - DSS

Ihu National Assembly

Ebe foto si, Olu Onemola

Iwu ị nọ n'ụlọ nke otu Ipob nyere ndị otu ya abụrụla okwu onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua karịsịa ndị ọrụ nchekwa dị iche iche na Naịjirịa.

Cheta na ndị agha na ndị uweojii sị dị na mbụ dọọ Ipob aka na ntị mana ugbua ụlọọrụ DSS agwala Ipob na ha agaghị eji anya ọma ele onye ọbụla dara iwu.

Ọ nụ na-ekwuru DSS bụ Peter Afunnaya, na ha ga-agba mbọ hụla na udo na nchekwa ga-dị na mpaghara Naịjirịa niile.

N'ofesi

'Skullcap' bụ okpu ndị Juu

Ebe foto si, Getty Images

Kọmishịọna mba Germany na-ahụ maka ịkpaoke ndị Juu bụ Felix Klein agwala ndị Juu ka ha kwụsị ikpu okpu ha ahụ n'ihu ọha n'ihi ịkpa oke megide ha na-arị ibe ya elu n'ọtụtụ ebe na mba.

Klein kwuru na ọnụ ọgụgụ ikpaoke megide ndị Juu rịrị elu n'afọ gara aga dịka gọọmentị si chọpụta, na enwere mpụ ịkpọasị dị 1,646 e mere megide ndị Juu n'afọ 2018.

Ebe mwakpo pụtara ihe e mere ndị Juu dị iri isii na abụọ n'afọ 2018.

N'egwuregwu

Messi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Messi ebee ọzọ

Valencia agbawala Barcelona obi site n'iji ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie ha ma buru Iko Copa del Rey nke afọ a.

Agbanyeghi nke a, onyeisi Barcelona bụ Josep Maria Bartomeu ekwuola na Ernesto Valverde ga aga n'ihu n'ịchịkọta Barcelona.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, Gburugburu: Ihe anyị ji echeta Gọv Ugwuanyi na nke anyị chọrọ n'aka ya ugbua