Asset declaration: 'Bịa kwupụta akụnaụba unu nwere n'ihu anyị'

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ dị mkpa

Ụlọọrụ CCB sị ndị ọchịchị bịa kpọọ okwu aha

Ndị ọchịchị ime obi onyeisiala Buhari

Ebe foto si, @Mbuhari

Ụlọọrụ Code of conduct agwala onyeisiala, osote ya, ndị gọvanọ na ndị niile ji ọkwa ọchịchị ka ha bịa kwupụtala akụnaụba ha tupu ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Mee.

Ụlọọrụ a kwuru na ọ bụrụ na ha emeghị nke a na ndị ọchịchị ga-echebiri ha n'ụlọikpe 'Code of Conduct'

Ha gara n'ihu kwuo na ndị nke na-abata n'ọchịchị ọhụrụ nwere ọnwa atọ ha bara n'ọchịchị ikwupụta akụnaụba ma ọ bụ a gbaa ha akwụkwọ n'ụlọikpe.

Cheta nna ọchịchị afọ anọ nke onyeisiala Buhari, Osote ya bụ Osinbajo, ndị Gọvanọ nakwa ndị ọzọ ga-akwakọrọ ọnụ n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Mee.

Oke ahụike ezuola Abia Steeti

Ọkanmụta Isaac Adewole

Ebe foto si, @NGRSenate

Abia Steeti eketala oke ego dị otu ijeri naịra n'aka gọọmentị etiti, maka nlekọta ahụike tara ọchịchị a kpọrọ Basic Health Provision Fund na bekee.

Mịnịsta ahụike bụ Isaac Adewole onye kwuru nke a n'Umuahia sị na ego bụ maka nlekọta ahụike ụmụnwaanyị na-amụ nwa, obere ụmụaka na-arịa ọrịa nakwa mgbochi ọrịa ịba.

N'ofesi

Ọkụ a gbara na mpaghara ụlọakwụkwọ Western Steeti nke Gujarat

Ebe foto si, Getty Images

Ihe ruru ụmụakwụkwọ iri na itoolu anwụọla , ebe iri abụọ merụrụ ahụ n'ọkụ ọgbụgba gbara n'ụlọakwụkwọ dị n'India.

Onye ọrụ mgbanyụ ọkụ kwuru na ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị a bụ ndị ọkụ gbagburu ebe ụfọdụ nwụrụ mgbe ha si n'elu ụlọelu ahụ na-awute.

A matabeghi ihe malitere ọkụ ọgbụgba a, mana o si n'otu klass gafee na ndị ọzọ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

N'egwuregwu

Ọgbọ egwuregwu Baki dị Azerbaijani.

Ebe foto si, Getty Images

Otu jikọtara ndị nwado otu egwuregwu Chelsea agbarụọla ma katọọ ndị nwee na ndị ọrụ Chelsea n'ihi etu ha sị na-eji akpasị ha agwa.

Ndị a kwuru na Chelsea achọghị inyere ha aka iji hụ na ha gara kirie asọmpi ikpeazụ Europa league ha na dị Arsenal ga-agba na Azerbaijani n'abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Mee.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ na-ajụ ihe mere eji buru asọmpi ikpeazụ nke Europa league gawa mba Azerbaijani.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa

Aha onyonyo, Gburugburu: Ihe anyị ji echeta Gọv Ugwuanyi na nke anyị chọrọ n'aka ya ugbua