Herdsmen killings: Anyị ka na-eme nnyocha banyere mmadụ isii e gburu n'Anambara - Ndị uweojii

Onye ọchi ehi bu egbe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onwere ndị Fulani na-achị ehi bu egbe ukwu agagharị

Ndị uweojii na steeti Anambara ekwuola na ha ka na-aga n'ihu ime nnyocha ndị mmadụ e gburu n'okpuru ọchịchị Anambara West na nso a.

Ndị a na-enyo na ha bụ ndị ọchịehi wakporo ndị mmadụ n ọ n'ụgbo ha dị na Agweopia , Iyiogbu na Iyinkolo, dị n' Anambara -West gbuo mmadụ isii ma merụọ ọtụtụ ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na e nwere ndị e gburu n'ebe ahụ, ma rụtụ aka na nnyocha gbasara nke a ka na-aga n'ihu.

Mgbe a jụrụ ya ka o nye kwuo nkọwa banyere nke a, ọ zara: ''a gaghị m ekwu ihe ọzọ, n'ihi nke a ga-emebiri anyị nnyocha nke ka na-aga n'ihu ugbu a.

O kwuru na kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Gandaura Mohammed, ka ọ dị ugbu a, e nyela ntụziaka ka e nwee ezi nchekwa n'ebe ahụ.

Ehi

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Nsogbu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụgbo na-emetụta ikọpụta ihe oriri

Haruna gbakwụnyere na ezigala ndị uweojii n'ebe ndị ahụ iji nyere nchekwa aka ebe ahụ.

O kwukwara na onye kọmishọna a akpọọla ndị isi nchekwa dị iche iche na steeti ahụ, nakwa ndị isi ọchịchị obodo dị iche iche na mpaghara ahụ iji mata ụzọ a ga-eji weghachita udo n'ebe ahụ.

N'okwu ya, kọmịshọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ bụ Chukwuemeka Adịnụba, kọwara na-enweela ezi mkpezi n'etiti ndị nwe obodo nakwa ndị na-achị ehi.

Akụkọ kọrọ n'ihe dịka mmadụ isii nwụnyụrụ anya, ebe ọtụtụ mmadụ meruru ahụ mgbe ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-achị ehi wakporo ebe a kpọrọ Agweopia, Iyiogbu nakwa Iyinkolo nke dị n'okpuru ọchịchị Anambara-West n'ụbọchị Tọzde izu gara aga.

Akụkọ ga-amasị gị: