Christian Chukwu: Femi Otedola agbatala ọsọ enyemaka

Otedola /Chukwu

Ebe foto si, @realFemiOtedola

Nkọwa foto, Chukwu bụbụ onye nchịkọta otu Super Eagles
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Egwu ọma ejula ọnụ ndị be Christian Chukwu na-arịa ọrịa dịka akajiakụ bụ Femi Otedola kwetere ikwụ ụgwọ ụlọọgwụ ya.

Ụgwọ ahụ ruru puku dọla iri ise.

Ụlọọrụ mgbasa ozi "Cable" depụtara na Otedola mere nke a iji kwado onye o chere fere ala nna ya n'ụzọ dịmma.

Otu akpọrọ Nigeria Football Federation ekwela nkwa ịnyere Chukwu aka.

Christian Chukwu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Christian Chukwu so na ndị mbụ butere iko mba ụwa Afrika

Chukwu onye dị afọ iri isii na asatọ chịrị otu egwuregwu bọọlụ Naịjrịa bụ Super Eagles mgbe ha mabutere iko mba Afịrịka mbụ n'afọ 1980.

Cheta na gọọmenti Enugwu steeti gọrọ ụkwụ na aka na o nweghị mgbe ha gbahapụrụ Christian Chukwu bụ onye dara nnukwu ọrịa ugbua.

Udedi Joseph bụ Kọmishọna egwuruegwu na-ekwu na gọmentị Enugwu akwụọla ụgwọ ihe niile na onye ọbụla na-arịọ ego n'isi ya bụ onye nrụrụaka.

Ọkụ gbara n'ọdọụgbọelụ Sam Mbakwe dị nOwere

Ọkụ agbara n'ọdọụgbọelu Owerri

Ebe foto si, @IamOAR

Ọdọụgbọelụ Sam Mbakwe dị na Owere gbara ọkụ n'ehihie Monde.

Ihe ọma dị ya bụ na emenyụọla ya bụ ọkụ ebe ebugharịrị nfeda ụgbọelụ.

Ụlọikpe Ukwu akwọpụla aka n'isi Magnus Abe

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ụlọikpe ụkwụ dị na Pọtakọt a tụfuola akwụkwọ Magnus Abe gbara ịgbagha onye meriri na ntụlịaka imeụlọ ndị APC mere na Rivas Steeti.

Nke a mere dịka otu akụkụ APC na Rivas họpụtara Tonye Cole, ebe nke ọzọ họpụtara Abe dịka onye ga-efe ọkọlọtọ pati ahụ na ntuliaka 2019.

Chief Justice Nigeria bụ Ibrahim Mohammed kpebiri ụbọchị Monde na ya bụ okwu enweghi isi na ọdụ.

Tanzania ga-eso mechie 'water proof'

Mizengo K Pinda

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Prime Minister mba Tanzanian bụ Mizengo K Pinda

Ụlọikpe ụkwụ dị na Pọtakọt a tụfuola akwụkwọ Magnus Abe gbara megide onye meriri na ntụlịaka imeụlọ ndị APC mere na Rivas Steeti.

Chief Justice Nigeria bụ Ibrahim Mohammed kpebiri ụbọchị Monday na ya bụ okwu enweghi isi na ọdụ.

N'egwuruegwu,

Anyị na-echebiri asọmpi Chelsea na West Ham n'abalịa,

Ire na izu ahụ mmadụ

Anụ ahụ mmadụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Emechiela ire na ịzụ anụ ahụ mmmadụ na mba ụfọdụ

Otu kpọrọ onwe ha International Organisation for Migration ekwuola na ọnweghị mgbe ha ji kwuo na iri na izu ahụ mmadụ juru eju na mba Middle East.

Onye kwuru nke bụ ọnye ọnụ na-eru n'okwu na otu ahụ bụ Ikechukwu Attah.

Gee nkeji anyị

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ndị agha Naijiria si na lekwara nwaanyị ha kuturu n'Aba

NỤgbọala Ndị agha Naijiria

Ebe foto si, PIUS UTOMI EKPEI

Ndị agha Naijiria Akụkọ kwuru na ụgbọala Hilux nke ndị agha Naijiria kuturu nwaanyị na-agara onwe ya ka ọ chọrọ ịgbafe okporoụzọ ụbọchị Fraide.

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọdachie ahụ akaghị ime ma ọ bụụ ụgbọala ahụ agbaghị n'okporo o kwesghị ịgba ma jirikwa oke ọsọ mee nke a.

Mana isiụlọọrụ ndị agha Naijiria kwuru n'akụkọ na ha eletaghị nwaanyị ha merụrụ ahụ abụghị eziokwu.

Na nkọwa ha, ha kwuru na ha bugara ya ụlọọgwụ ma kwụkwara ya ụgwọ ụlọọgwụ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ha kwukwara na ha kpọkwara ndị ezinaụlọ nwaanyị ahụ ndị biara na-eleta ya n'ụlọgwụ.

Ndị ntọ atọrọla onyeisi ndị ọrụ imenyụ ọkụ na Legọs

Rasaki Musibau

Ebe foto si, facebook.com/Lagos-State-Fire-Service

Nkọwa foto, Rasaki Musibau nọ n'etiti

Onyeisi ndị uweojii bụ Bala Elkana ekwuola na ndị ntọrị nwụchịkọrọ Rashidi Musibau na mmadụ isii ọzọ na mpaghara Ikorodu n'abalị Satọde akpọbeghi ezinụlọ ndị ha tọọro.

Rashidi Musibau bụ otu n'ime ndị isi ndị ọrụ gbatagbata na Legọsi.

Elkana kwuru na ndị ntọrị tọrọ ya na mmadụ isii ndị ọzọ ya na ha so n'ime obodo Ikosi-Ejirin, ọ sị na ndị ntọrị si ebe mmiri nọ wee gbochie ha n'ụzọ, tọrọ ha gbaba n'ime ụgbọ mmiri ha.

Ụgbọelu bepụrụ isi onye agha

Ụgboelu

Ebe foto si, Getty Images

Ihe nya mmiri mere mgbe mberede kwanyere otu onye agha si agha lọta na mma ụgbọelu nke bere isi ya tọgbọ.

Eniela nwa amadị a so ebuso Boko Haram agha n'usoro ndị alakuba.

Ndị ogbunigwe nwụrụ eruola mmadu ise

Obodo Konduga

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ọrụ gbata gbata na Maịduguri na-akọwa na ndị nara mụọ site na ogbunigwe ndị omekome abụọ gbara ụnyaahu eruola mmadụ ise ka ndị ihe a metụtara n'eru mmadụ iri anọ na ise.

Ihe a mere mgbe ndị a na-eche na ha bụ ndị Boko Haram gbara ogbunigwe ha bu n'ahụ na obodo Muna Dalti.

N'ofesi

Kirstjen Nielsen

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Kirstjen Nielsen bidoro ọrụ n'afọ 2017

Onyeisi ngalaba na-ahụ maka nchekwa obodo na mba Amerịka bụ Kirstjen Nielsen esorola n'ime ndị Onyeisiala Donald Trump tinyere n'ọrụ tinyere akwukwọ arụkwaghịm.

N'egwuregwu

Nwaafọ Naịjirịa bụ Odion Ighalo so na ndị denyere aha ya n'akwụkwọ mgbe Shanghai Shenhua ji ọkpụ goolu ise asatara otu sị Beijing Renhe ntọọị n'asọmpị Chinese Super League asụru ụbọchịụka

Lee ihe nkiri anyị tata

Aha onyonyo, Lee Alex Nwa-Ephraim Akwaiwu nwa afọ Igbo na-arụ ụgbọala

Akụkọ ga-amasị gị