Sam Mbakwe International Cargo Airport: Ụgbọelu amalitela ifebata ma fepụ n'ọdọụgbọelu a- Ndi uweojii

Ọdọụgbọelu Owere ka ọ na-agba ọkụ

Ebe foto si, Daniel Nwachukwu

Nkọwa foto, Ọdọụgbọelu Owere ka ọ na-agba ọkụ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụgbọelu amalitela ifebata ma fepụ n'ọdọụgbọelu Owerri dịka ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Orlando Ikeokwu

Mgbe anyị nụrụ akụkọ a na mbụ, e kwuru na ọkụ na-agba n'ọdọụgboelu Sam Mbakwe dị n'Owere n'ehihie tata bụ Monde.

Aha onyonyo, Sam Mbakwe Airport: Nwaanyị dị ime ji nwapem gbalahụ ọnwụ ka ọkụ na-agba

Mana ndị ọrụ gbatagbata n'odoụgbọelu mechara menyụọ ọkụ ahụ, dịka onye ntaakụkọ anyị bụ Paul Chukwu onye gbara ụgbọelu si Legọs gawa Owere n'ehihie a kwuru.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

A mabeghị ihe butere ọkụ ahụ nke a na-enwe akụkọ ndị merụrụ ahụ mana ọkụ ahụ gbapịara ọtụtụ ihe tupu e menyụọ ya.

Onye ọrụ menyụọ ọkụ ahụ

Ebe foto si, Daniel Nwachukwu

Nkọwa foto, Onye ọrụ menyụọ ọkụ ahụ

Ọdachie ahụ meburu ka e dugharia nfeda ụlọelu ndị kwesiburu ifeda ebe ahụ, gaa ọdọugboelu Pọtakọt.

Ihe ọkụ gbara n'ọdọụgbọelu Owere repịara

Ebe foto si, Daniel Nwachukwu

Dịka a na-ekwu, o nweghị onye a nụrụ nwụrụ n'ihe mberede ọdọụgbọelu ahụ.

Ihe ndị ọkụ mebiri

Ebe foto si, Daniel Nwachukwu

Nkọwa foto, Ihe ndị ọkụ mebiri

Anyi ga-ewetere unu akụkọ ka o si eme.

Ihe ndị ọkụ mebiri

Ebe foto si, Daniel Nwachukwu

Nkọwa foto, Ihe ndị ọkụ mebiri