Nnamdi Kanu bụ onye ụjo na-eduhie ụfọdụ ndị ntoroọbịa - SERG

Nnamdi Kanu pụtara ihe ọzọ n'ime otu afọ ndị agha Naịjirịa wakpochara ụlọ ya.

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Otu kpọrọ onwe ha South East Renewal Group (SERG) amaala onye ndu IPOB bụ Nnamdi Kanu aka n'ihu dịka o mechara mgbasa ozi n'igwe redio.

Otu a gwara Kanu na ọ bụrụ na ọ kpọrọ onwe ya dike Biafra ka ọ wụchie gosi onwe ya na abụghị ị nọ na mba ọzọ agbọ ụja.

N'ozi nke si n'ọnụ onyeisi otu a bụ Charles Mbani, o kwuru na ọ bụ ihe nwute na Kanu bịara ibute ọgbaghara n'etiti ndị ọwụwaanyanwụ.

O kwuru na ndị Igbo agbakechabeghi site na nsogbu ya na ndị otu IPOB ya tinyere ha n'otu afọ gara aga.

Mbani kwuru na Nnamdi Kanu na ndị otu IPOB ya anaghị ekwuchite ọnụ ndị Igbo niile.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

N'okwu ya " Kanu bụ onye ụjọ na-eduba ndị ntoroọbịa Igbo na nsogbu nakwa ọnwụ ha na-erughi eru."

"Ya mere SERG na-agwa Kanu na ndị otu ya na ndị Igbo ga-apụta n'uju ime ntuliaka n'afọ 2019 na-enweghi mkpagbu ọbụla."

Mbani kwuru na Kanu maa ụkwụ n'ala Igbo na ndị ntoroọbịa Igbo ga-eji aka ha nwụchie ya ma nyefe ya n'aka ndị uweojii.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, IPOB: A taghịm Nnamdi Kanu ụta