Nigeria election 2019: Ndigbo agbakpuru n'ochendo hapụ ka mmiri maa okeọkpa?

Njirimara PDP,APC nakwa APGA

Ebe foto si, PDP/APC/APGA

Obi na-atọ ọtụtụ Ndigbo ka nnu kemgbe akụkọ pụtara n'ụbọchị Wenezde na Inec kpọpụtara aka na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike dịka onye meriri ntulaiaka gọvanọ na steeti ahụ.

Wike nke PDP onye nwetara 886,264 ma jiri vootu dị 712,405 merie Biokpomabo Awara nke AAC, onye nwetara 173,859 na mmeju ntuliaka e mere na steeti ahụ na nsonso a.

Etu Ndigbo si kwadoo PDP na Rivas nakwa na ntuliaka onyeisiala na nke ọkwa gọvanọ kpalitere okwu ma Igbo a na-akọ n'ugbo onye ọzọ hapụ nke ha dịka pati e jiri mara ha bụ APGA na-asọ ngọngọ ka ọkụkọ udummiri.

Mpụtara ntuliaka e mere gosiri na Igbo gbagara n'okpuru ochendo PDP n' eleghị anya n'azụ, ma hapụ mmiri ka ọ maa APGA n'anya.

APGA gbara ọyụpa nke na APC bụ pati batara ọhụrụ n'ala Igbo kara ya nweta vootu.

Iji maa atụ, na ntuliaka ọkwa onyeisiala n' Anambara, PDP nwetara vootu dị 524,738, APC nwetara 33,298, ebe APGA nwetara vootu dị 30,034.

Lee tebulu mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala na gọvanọ:

Mpụtara Ntuliaka kwa Onyeisiala n'Ọwụwa Anyanwụ

Mpụtara Ntuliaka kwa Gọvanọ n'Ọwụwa Anyanwụ

Ndigbo ahụrụ PDP n'anya karia APGA?

Na nkọwa ya, onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Collins Okeke kọwara n'ihe mere Ndigbo jiri nye PDP nkwado pụrụ iche na ntulaiaka 2019 bụ maka na nwafọ ha bụ Peter Obi so Atiku Abubakar zọọ ọkwa onyeisiala n'aha pati ahụ.

Okere, onye bụkwa onye na-alụ ọgụ maka ikike dịịrị onye kwuru na nke a apụtaghị na ha ajụla APGA.

Aha onyonyo, Rivers Election Result: Ndigbo ajụghị APGA- Onye ọnụ na-eru n'okwu

N'otu aka ahụ, Chukwunonye Okereke kwụkwara na ọ bụ n'ihi na PDP bụ pati ọha dịka o kwuru na ọ na amasị Ndigbo isonye ebe ọkụ na-enwe n'elu, nakwa ebe a naghị akpa oke.

"Ọchịchọ PDP na Ndigbo dịka nnu na mmanụ."

"Onye Igbo anaghị eme na nke a bụ nke anyị. Igbo bụ ihe bekee kpọrọ 'global citizen'.

"PDP bụ pati ndị mmadụ jịkọtara aka were bido. O nweghị onye nwe ya."

Aha nkeananụānụ, 'Ihe mere ọtụtụ Ndigbo ji akwado PDP karia APGA'

Okereke, onye kwuru na ọ bụ Odumegwu Ojukwu ka Ndigbo soro banye APGA sị na ọ bụ 'mụ nwe pati' so na nsogbu na-amigbu APGA

Akụkọ ga-amasị gị: