Rivers Election Collation: Wike awụọla onye Amaechi na-akwado n'ala

Ebe foto si, Nyesom Wike
Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas Steeti emeriela ọzọ na ntuliaka ọkwa gọvanọ nke Rivas Steeti.
Ụlọọrụ Inec na Rivas Steeti kpọpụtara mmeri Wike n'ehihie Wednezde n'ọnụ vootu dị 886,264 dịka Ọkamụta Teddy Adias bụ onye 'Returning Officer' na ntuliaka ahụ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1
Onye AAC bụ Biokpomabo Awara nwetere vootu dị 173,859 iji na-esote Wike n'azụ na ntuliaka emere n'abalị itoolu nke ọnwa Maachị
Mpụtara ntụliaka a bụ vootu si n'okpuruọchịchị iri abụọ na otu n'ime okpuruọchịchị iri abụọ na atọ nke mejupụtara Rivas Steeti.
Okpuruọchịchị Abua Odua na Gokana enweghi ihe mpụtara ọbụla n'ihi ọgbaghara dapụtara mgbe a na-eme ntuliaka nakwa mgbe a na-agụkọ mpụtara ntuliaka ebe ndị ahụ.
Nke a si na mkpesa Gbaranor Godwill Christian mere mkpesa nke a dịka a na-achọ ịgụkọ mpụtara ntulaiaka.
Ụlọọrụ Inec na Rivas Steeti malitere ọzọ na Wenezde ịkpọpụta mpụtara vootu ọkwa gọvanọ na Rivas Steeti.
Na mkpọpụta vootu nke taa mgbe e dere akụkọ a, Gọvanọ Nyesom Wike nke PDP ji ihe karịrị vootu puku narị ise emeri.
N'okpuruọchịchị obodo Ogu Bolo, AAC nwetere vootu 814, ebe PDP ji 11855 vootu.
N'okpuruọchịchị obodo Obio-Akpor, AAC ji 7495, PDP nwetere 281164 vootu.
Okpuruọchịchị Asari Toru, AAV nwetere vootu 18945, PDP ji vootu 32172.
Na nke Degema, AAC ji vootu 5071, PDP nwetere 12133.
Ọnụgụgụ vootu sị n'okpuruọchịhcị iri na itoolu bụ PDP: 763,603, AAC: 162,180.
Onye nke na-esote Nyesom Wike bụ Biokpomabo Awara nke AAC.
Cheta na ha kwụsịtụrụ mkpọpụta mpụtara ntuliaka Rivas Steeti rue n'elekere iri nke ụtụtụ taa bụ ụbọchị atọ n'ọnwa Epụrel.
Ha malitere ịkpọpụta mpụtara n'ehihie ụnyaahụ dịka ụlọikpe chabichara ikpe n'akwụkwọ ndị pati AAC na ndị ọzọ gbara ka akwụsị Inec ikpọpụta mpụtara ntuliaka a.
Ndị ọrụ Inec si n'okpuru ọchịchị iri na asaa nke steeti ahụ zuruoke ebe ndị ọrụ nchekwa jupụtara n'isi ụlọọrụ ndị Inec dị na Rivers Steeti bụ ebe a na-eme mkpọpụta vootu ahụ.
Ndị anya na-ele na ntuliaka bụ Nyesom Wike, bu aka na-achị steeti ahụ, na Awara Biokpomabo, na-azọ ọchịchị n'okpuru pati AAC.
Dịka ọ dị ugbua, a kpọpụtala mpụtara okpuruọchịchị obodo dị iri na ise ndị gụnyere Portharcourt, Ikwere, Andoni, Oyigbo, Eleme, Opobo-Nkoro, Bonny, Okrika.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2
Ndị ọzọ gụnyere Akuku-Toru, Omuma, Tai, Ahoada, Emohua, Etche na ONELGA.
N'ime okpuruọchịchị obodo iri na ise ndị a, AAC meriri na abụọ ebe PDP meriri iri na atọ.
Mana a kwụsịla mkpọpụta mpụtara ntuliaka a rue n'elekere iri nke ụtụtụ echi bụ ụbọchị atọ nke ọnwa Epụrel, 2019.












