Rochas Okorocha kachiri ntị - Victor Umeh

Aha onyonyo, Imo Elections: "A dọrọ m Rochas aka na ntị maka APC, ọ jụ"

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, o kwuru na oge na-abịa mgbe ndị Imo ga-ajụ Rochas ajụjụ maka akụnaụba steeti ahụ.

O kwukwara na ọ dọrọ ya bụ Rochas aka na ntị maka isonye n'APC mana Rochas siri ọnwụ gaa n'ihu.

Cheta na otu APC kwụsịrị Rochas ọrụ n'ike n'otu ha ebe Inec jụrụ ịnye ya asambodo mmeri ya.

Dịka ọ dị ugbua anyị na-agbalị ịnụ olu Rochas gbasara ebubo a mana ọ zabeghi.

Gee ihe Victor Umeh kwuru n'uju: